Eke Hit: A tụọla nwa dibịa a mkpọrọ maka ebubo metụtara ịgwọ okeite

Ekene Igboekweze
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Ukwu nke Anambara steeti dị n'Ọka atụọla dibịa a ma ama mkpọrọ afọ isii ebubo metụtara ịgwọ okeite nakwa igosi akụ a kpara n'ụzọ eweghị anya ma were ya ya emesasị ndị ntorobịa anya na soshal midia.

Ebubo e boro ya gụnyere ịgwọ okeite, iji anwasi emesasị ndị ntorobịa anya na soshal midia nakwa ịgwọ ọgwụ awele.

N'ikpe nke ọkaikpe Jọstis Jude Obiora nọ n'isi ya a tụrụ Ekene Igboekweze a ma dịka 'Eke Hit' mkpọrọ afọ isii, dịka a mara ya ikpe n'ebubo abụọ n'ime atọ e boro ya.

Aha onyonyo, Eke Hit: A tụọla nwa dibịa a mkpọrọ afọ isii maka ịgwọ okeite

Dịka Iwu Anambra Nchekwa Anambra siri kwuo, Eke Hit kwesịrị ịnata mkpọrọ afọ iri 12 ma kwụọ nha nde naira iri abụọ(N20m), mana dịka ndị nwunye Eke Hit nakwa nanne ya nwoke rịọrọ ọkaikpe ka e belata ntaramahụhụ ya, Jọstịs nyere ya afọ isii na akwụghị nha ọbụla.

Ngụkọ mmalite ọnụnọ ya n'ụlọikpe ga-ebido n'ọnwa Febụwarị afọ 2025 bụ oge a nwụchiri.

Ka o si aga n'ikpe 'Eke Hit'

Foto gosiri Ekene Igboekweze bụ dibịa a maara nke ọma dịka Eke Hit

Onye dibịa a ma ama bụ Ekene Igboekweze a ma ama dịka 'Eke Hit' ekwetala na ikpe mara ya n'ebubo atọ e boro ya bụ nke e ji ekpe ya ikpe n'ụlọikpe Ukwu dị n'Akwa, Anambra steeti n'ụbọchị Fraịde abalị 18 nke ọnwa Septemba 2026.

Cheta na gọọmenti Anambra steeti kpụpụrụ Eke Hit ụlọikpe maka ebubo metụtara ịgwọrọ ndị ekperima ọgwụ, ịgwọrọ ndị mmadụ okeite nakwa igwu ndị mmadụ chamdum.

Chetakwa na ndị ọrụ nchekwa Anambra steeti nwụchiri Eke Hit n'ọnwa Febụwarị afọ 2025 dịka gọọmentị Anambra steeti tinyere iwu ọhụru n'afọ 2025 nke machiri ịgwọ ọgwụ okeite bụ nke ha kwuru na o nwere metụta n'ọnọdụ nchekwa nke steeti ahụ.

Iwu ahụ a kpọrọ 'Iwu maka Nchekwa Anambra nke afọ 2025 (Anambra State Homeland Security Law 2025') megidere ndị dibịa na ezenwaanyị adịgboroja dịka a hụtara n'aka ha dị n'ihe na-ebute nsogbu nchekwa na steeti ahụ.