Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 15, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 15, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ndịagha elu Nigeria ekwela ndị obodo Igbokoda dị n'Ondo steeti nkwa na ha ga-atụle nsugbo isi ọjọọ na mmetụta ihe mberede ụgbọelu ha kpọkara na nso nso a na-enwe na gburugburu obodo ahụ.
- N'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Air Commodore Ehimen Ejodame wepụtara taa bụ Tọzde, ka ndịagha ahụ kwuru na ha ghọtara ọnọdụ nchegbu, na enweghị obi ike nke ihe mberede ahụ nwereike ibute, ma kwuo na ha na-eleba anya nke ọma n'ihe ndị na-enye obodo ahụ nchegbu.
- Mba United Kingdom ekwuola na ha ga-egbochi ụmụafọ Eritrea niile ịbanye na mba ha, ma ọ bụrụ na gọọmenti mba ahụ dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Africa ekweghị ka a kpọghachite ndị mbịarambịa na-eji obere ụgbọmmiri esi mba ha abata UK.
- Ndị ọrụ nchekwa Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) achọpụtala ọwara dị n'okpuru ala, ọnụ ụzọ e wusiri ike nke ukwuu, yana ụzọ ndị a na-enyo enyo na e si agba ọsọ, dị n'ime otu ụlọ a na-ewuchabeghị nke ọma na Camp 74, dị nso n'obi ọchịchị gọọmenti dị n'Asaba, Delta state.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






