A gbaala dibịa 'Mmụọ Mmiri Afulanya' n'anwụ maka ebubo ịgwọ ọgwụego mbute

Mgbe Agunaechemba duu Mmụọ Mmiri Afulanya gaa n'ụlọ ya dị na Nnewi.

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Aha onyonyo, Ndị omenala asaala gọọmenti Anambra steeti maka nnwuchi mmụọ mmiri

Gọọmenti Anambra Steeti agbaala dibịa bụ John Paul Ezenagu e ji 'Mmụọ Mmiri Afulanya maara n'anwụ make ebubo ịda iwu nchekwa 'Homeland Security Law.

Ha gara n'ihu gaa n'ụlọ nwamadị a dị na Nnewi ime nnyocha ma chọpụta etu o si arụ ọrụ ịgwọ ọgwụ ya.

Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Soludo bụ n'ọrụ nchekwa bụ Ken Emeakayi kwuru na Ezenagu na-arata ụmụokoroọbịa na ụmuagbọghọ na-ekwe ha nkwa ibute ego ọsịsọ ma ọ bụru ha saa ahụ na mmiri dị n'azụ ụlọ ya.

Unu ga-asị onye omenala Islam maọbụ Kraịst gosi unu Chi ya? - Duru Agwu

"A gaghị agwa onye ụkọchukwu Kraịst maọbụ onye na-aka ụka Islam ka o gosi ha Chi ha na-efe. Nke a bụ mkpagbu mmadụ."

Okwu a bụ okwu Maazị Duru Agwu bụ onye kwenyere n'omenala Igbo.

O kwuru na agwa dị etu a megidere iwu nchekwa na-achị Anambra Steeti a kpọrọ 'Homeland Security Law, ma kwuo na a dọọla ya aka na ntị maka ihe ọ na-eme mana ọ gara n'ihu na-eme ya.

Emeakayi kwuru na ọ bụrụ na e mechaa nnyocha ahụ, na a ga-enyefe ya n'aka ndị uweojii maka imekwu nnyocha ma taa ya ahụhụ ruru ya.

Ezenagu rịọrọ gọọmentị Anambra Steeti na ụmụafọ ha arịrịọ mgbaghara ma kwuo na ọ gaghị eme ya ọzọ.

O kwuru na ọ bụ ya ji aka ya gwuo olulu mmiri ahụ nọ n'azụ ụlọ ya ma chere na o nwereike ime ihe ọbụla masịrị ya na mmiri ahụ.

Etu e si nwuchie 'Mmụọ Mmiri Afulanya'

Dibia Mmụọ mmiri yi uwe ọcha ma nọrọ n'oche n'ụlọọrụ ndị Agunaechemba na mgbe o yi uwe agụ, kporo okpu agọrọ.

Ebe foto si, De Young Chief Priest/Facebook

Agunechemba anwuchiela 'Mmụọ Mmiri Afulanya n'ụbọchị Tọzde 12 Maachị 2026 dịka ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia si gosi.

N'ihe onyonyo ahụ, nwamadị a nọ n'isiụlọọrụ ndị Agunaechemba kọwaa aha ya dịka Ikechukwu JohnPaul Ezenagu bụ onye e ji 'Mmụọ Mmiri Afulanya' wee maara.

"Aha m bụ Ikechukwu JohnPaul Ezenagu, e ji Mmuọ Mmiri Afụlanya wee maara. Anọ m n'ụlọọrụ ndị Agunaechemba n'ụbọchị Tọzde 12 Maachị, 2026."

Ụmụokoroọbịa na-asa ahụ na mmiri ma mara akwa ọcha.

Ebe foto si, De Young Chief Priest/Facebook

Akụkọ banyere nwuchi ya malitere ifesa na soshal midia mana o dochabeghi anya ihe mere e jiri nwuchie nwamadị a.

Cheta na gọọmenti Anambra Steeti nyere iwu n'afọ 2025 ma machie ndị Dibia na ndị Ezenwaanyị ịgwọ ọgwụego dị iche iche nke gụnyere okeite, ibobo nakwa ndị ọzọ.

Nke a mere e ji nwuchie ndị dibia a ma ama dịka Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke Hit n'afọ 2025. E mechara tụọ Akwa Ọkụkọ nga afọ abụọ nke fọrọ naanị ọnwa iri na otu ugbua. Ebe okwu Onyeze Jesus na Eke Hit ka nọ n'ụlọikpe.

Mmuo mmiri so n'otu n'ime ndị dibia na-egosi aka ọgwụ ha na soshal midia mana a maghị kpọmkwem ihe mere ndị Agunaechemba jiri nwuchie ya.

Onye bụ dibịa Mmụọ Mmiri Afụlanya?

Mgbe Agunaechemba duu Mmụọ Mmiri Afulanya gaa n'ụlọ ya dị na Nnewi.

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

Ezigbo aha ya bụ John Paul Ezenagu bi onye obodo Awka mana o bi na Nnewi bụ ebe ọ na-eme ihe ịgwọ ọgwụ ya. Aha Arụnsị ọ na efe bụ Ezenwaanyi Ekulọ.

Ọ na-eme ọtụtụ ihe ngosi na soshal midia ebe ọ na-agwọ ọgwụ ya, ihe ndị ahụ gụnyere;

  • Ịchụaja na mmiri kwa mgbe kwa mgbe
  • Ịsa ọtụtụ ndị ntoroọbia ahụ n'ime mmiri, si na ọ na-asapụ ha ụchụ.
  • Ịgba ndị mmadụ ọtọ ma saa ha ahụ m'ime mmiri
  • Igbunye ọbara anụmanụ n'ime osimiri
  • Ọ na-agha ego aghara aghara ma ọ gaa mmemme na ọtụtụ ọgwụ ndị ọzọ.

Ihe dika izuụka ole ma ole ka gara aga, o gosiri ebe o ku nwa ya nwaanyị a mụrụ, gaa kpee ekpere na mmiri ma gụọ nwata ahụ 'Ezenwaanyi Ekulo'.