Favour Agboro: Etu aka si kpara nwoke a sị wakporo nwata nwaanyị nke mere ka agbọghọ ahụ kwụọ ụdọ

Ifeanyi Ogbonna na Favour

Ebe foto si, NPF/Favour Agboro/Facebook

Nkọwa foto, A na-enyo Ifeanyi Ogbonna maka ebubo idina Favour Agboro n'ike
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii Delta steeti ejidela Ifeanyi Ogbonna, onye ọtụtụ mmadụ maara dịka 'Odogwu of Asaba', maka ebubo na o dinara nwata nwaanyị , Favour Agboro dị afọ 20, n'ike.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti bụ Bright Edafe weputara na Wednezde, o kwuru na nwata nwaanyị ahụ si Ugheli gaa Asaba n'abalị mbụ nke ọnwa Juun,afọ 2026 mgbe Ogbonna kpọrọ ya ka ọ kuziere ya ọrụ imepụta ihe onyonyo n'ịntanet.

Ifeanyi Ogbonna bụ onye a kụrụ ịga n'aka bụ onye a na-enyo maka idina nwagbọghọ n'ike

Ebe foto si, NPF

Nkọwa foto, Ifeanyi Ogbonna bụ onye a na-enyo maka idina nwagbọghọ n'ike na Delta State

Mgbe nwata nwaanyị ahụ rutere Asaba,Ogbonna kpọgara ya n'otu ụlọ oriri na nkwari ebe e boro ya ebubo na o dinara nwata nwaanyị ahụ n'ike, dịka ndị uweojii siri kwuo.

Nwata nwaanyị ahụ laghachiri ụlọ nne na nna ya n'ọnọdụ mwute ma kọọrọ ha ihe mere ya.

Nwata nwaanyị ahụ mechara kwụọ ụdọ , kwuru nihe onyonyo o wepụtara tupu ọ nwụọ na ihe ọ gabigara butre ya nsogbu ịdamba obi nke Bekee kpọrọ 'depression'.

Mbọ nile a gbara ịzọta nwata nwaanyị ahụ ndụ amịtaghị mkpụrụ.

Mgbe ndị uweojii natara mkpesa gbasara okwu a, ha kwuru na ha malitere nyocha nke mere ka ha jide Ifeanyi Ogbonna.

Ha kọwara na nnyocha ka na-aga n'ihu iji chọpụta nke ọma ihe niile mere n'okwu a.

Komishọna ndị uweojii na Delta, Yemi Oyeniyi, kwuru na a ga-enyocha okwu a nke ọma ma mee ihe iwu kwuru ma ọ bụrụ na e nwee onye a hụrụ na o mere mpụ.