Ndị uweojii ejidela Olivia Patrick, ThankGod Mourice maka ebubo igbu onye uweojii n'Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images / Imo state command
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Olivia Patrick bụ nwoke dị afọ 31 nakwa ThankGod Mourice dị afọ 25 ka ndị uweojii jidere maka ebubo igbu onye ụweojii.
Dịka ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Okoye Henry wepụtara si kwuo; a na-enyo enyo na aka Olivia Patrick nakwa ThankGod Mourice dị n'ọnwụ onye uweojii ahụ e gburu n'ụlọ kọmịshịọna Imo steeti na-ahụ maka azụmụahịa na itinye ego e ji achụnta ego bụ Rex Anunobi.
Henry Okoye sị na e gburu onye uweojii ahụ n'abalị iri na anọ nke ọnwa Septemba 2026.

Ebe foto si, Nigeria Police Imo state command /Facebook
Ọ kọwara na kọmishịọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Audu Garba Bosso nyere iwu ka a chọpụta ihe kpatara e ji gbuo onye uweojii ahụ n'ụlọ Rex Anunobi.
Audu Garba kọwara ihe mere dịka ọ nnukwu mgbawaobi ọkachasị dịka e si gbuo onye uweojii ahụ n'ihu ọrụ ya.
Ọ gwara ohaneze ka ha saa anya mmiri ma kwuo na ndị uweojii na-agba mbọ iwete ezigbo ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ.


























