Director Pink: Nwada na-ahazi ihe onyonyo egwu na-ewu ewu na Nigeria

Aha onyonyo, Director Pink: Nwada na-ahazi ihe onyonyo egwu na-ewu ewu na Nigeria
Director Pink: Nwada na-ahazi ihe onyonyo egwu na-ewu ewu na Nigeria
Mgbe e biputara ya

Director Pink: Nwada haziri ihe onyonyo egwu ‘Beautiful’ nke Phyno, ‘Abracadabra’ nke Wizkid na '10 Kilo’ nke Davido nakwa ọtụtụ ndị ọzọ gwara BBC okwu.

Nwada Praise Onyeagwalam e ji 'Director Pink' maara bụ onye na-atụziaka n'ime ihe onyonyo egwu ndị a ma ama na Nigeria.

N'okwu ya "Tupu m banye mahadum, ana m ahazi onyonyoo n’ụlọụka. Mgbe m banyere n’ogogo nke atọ na nke anọ [na mahadum] ka m nwetere igwe onyonyoo nke m.

"Ọ bụ oge ahụ ka m banyere imepụta ihe nkiri. Emeela onyonyoo maka Davido, Wizkid, Burna Boy, Phyno, Flavor. 10 Kilo nke Davido tipụtara.

"Ihe mere o jiri siere m ike imepụta egwu Davido bụ maka na ndị ọchọmma anyị chọrọ iji mee onyonyoo ahụ bụ ndị nwere ahụ.

"Ọ bụ ihe rara ahụ inweta ndị ọchọmma nwere ahụ ma bụrụkwa ndị ọ na-amasị ịpụta n’onyonyoo. Mana ihe na-atọ m ụtọ bụ na mgbe onyonyoo egwu ahụ pụtara, ọ masịrị ndị mmadụ.

"Pinkline Academy bụ ụlọakwụkwọ anyị na-akụziri ndị ntoroọbịa nakwa onye ọbụla chọrọ ịhazi oyonyoo maọbụ imepụta onyonyo".