Kedụ etu ị ga-esi mara mmanya ọkụ adigboroja?
Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ adigboroja na Nigeria bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (Nafdac) achọpụtala ma machie ụlọọrụ na-arụpụta ma na-ere mmanya adigboroja n'ọdọahịa Lagos International Trade Fair Complex.
Nafdac kwuru na ndị ọrụ ha wuchiri n'ọdọ ahịa ahụ ma machie ụlọahịa dị iri abụọ e kwuru na-atụ mgbere mmanya nakwa ihe adigboroja ndị ọzọ.
Dịka ozi Nafdac wepụtara si kwuo, a nwụchiri mmadụ abụọ ma kwuo na ọnụego ngwaahịa adigboroja ahụ a machiri ruru ijeri naịra abụọ (N2bn).
Nafdac kọwara na ndị ọrụ nnyocha ha chọpụtara ndị na-arụpụta mmanya ọkụ adigboroja a ma ama nke nwereike imetụta ahụike mmadụ.
N'ihi nke a Nafdac kpọrọ oku ka ọhanaeze tinye anya na mmiri iji gbanarị ịzụta ihe oriri maọbụ ọṅụṅụ adigboroja ma gwa onye ọbụla nwere ozi banyere ụlọọrụ maọbụ ndị na-arụpụta ma na-ere ihe adigboroja ka ha kpọtụrụ ụlọọrụ Nafdac site n'akara ekwentị mkpesa ha.
Dịka onye na-eme dorime nakwa ekpori ndụ n'ụlọ oriri na nkwari, kedụ etu ị ga-esi mara mmanya maọbụ ihe adigboroja ndị ọzọ?
Tupu ị zụta mmanya maọbụ ihe oriri ọbụla, Nafdac kwuru ka ị hụ na ihe ahụ ị chọrọ ịzụ nwere P anọ.
P anọ a pụtara Product, Place, Price, Packaging n'olu bekee.
P nke mbụ bụ Product: Nke bụ ị mara ihe ị chọrọ ịzụ.
P nke abụọ bụ Place: Ọ dị mkpa ka ị I lee anya ma mara ebe a rụpụtara ihe ahụ ị chọrọ ịzụ.
Nke anọ bụ Price: Nafdac kwuru na oge ụfọdụ, ọnụahia ngwaahịa adigboroja na-adị oke ọnụala. Ọ bụrụ na nke a mee, ihe ọ pụtara bụ na ihe ahụ nwereike ịbụ nke adịgboroja.
Nke ikpeazụ bụ Packaging: Etu e si kechie ma hazie ihe ị chọrọ ịzụ bụ ụzọ ọzọ ị ga-eji mara ka ọ bụ adịgboroja.
Nafdac kwuru na I mee ihe ndị a, ọ ga-enyere gị aka gbanarị ịzụta ihe adigboroja n'ahịa.
Ihe ọzọ dị mkpa Nafdac kwuru bụ ịhụ na mmaya, mmiri nakwa ihe oriri ndị ọzọ ị chọrọ ịzụ nwere akara nkwado Nafdac a kpọrọ 'Nafdac number' n'olu bekee.



