Simon Ekpa: Ebe ụlọikpe Finland gbadoro ụkwụ butuo afọ ole ọ ga-anọ na nga

Aha onyonyo, Ebe ụlọikpe Finland gbadoro ụkwụ butuo afọ ole Ekpa ga-anọ nga
Simon Ekpa: Ebe ụlọikpe Finland gbadoro ụkwụ butuo afọ ole ọ ga-anọ na nga
Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe na mba Finland ewedatala afọ ole Simon Ekpa ga-anọ n'ụlọ nga site afọ isii nwetuo ya afọ anọ.

Simon Ekpa bụ onye a ma ama na-azọ nwereonwe Biafra mana ụlọikpe 'Päijät-Häme District Court' dị na mba Finland tụrụ nga afọ isii maka ebubo iyi ọha egwu.

Ekpa gara ụlọikpe mkpeghari maka ikpe Paija-Hame District court mara ya.

Ebubo e boro Ekpa gbadoro ụkwụ n'iyi ọha egwu nakwa ịkpọ oku ọgbaaghara na ọwụwa anyanwụ Nigeria.

Ụlọikpe mkpegharị ahụ kpebiri na Ekpa ji akara soshal midia ya kpọọ oku ọgbaaghara bido n'ọnwa August 2021 ruo November 2024; mana Ekpa na-ekwu sị na ya ebughi ịkpọ oku ọgbaaghara n'obi n'ihe niile ya mere na soshal midia.

Mana kedụ ihe mere ụlọikpe mkpeghari ji wedeta afọ ole Ekpa kwesiri ịnọ na nga?

Ọsịsa ajụjụ a bụ na ụlọikpe ahụ tinyere anya n'ọnọdụ butere Simon Ekpa ime ihe o mere ma jiri maka ya nwedata afọ ole ọ ga-anọ na nga n'agbanyeghi na o kwetere na ọ dara iwu ndị ahụ.

Ụlọikpe ahụ kwuru na ihe na-eme ugbua na ọwụwa anyanwụ Nigeria ezughioke ịkpọ ọnọdụ agha.

Mana ọkaiwu na-anochiteanya gọọmenti gwara ụlọikpe na afọ anọ ọ sị Simon Ekpa nọrọ na nga erughi ka ntaramaahụhụ o kwesịrị ịta maka ebubo e boro ya.