Chukwu ji tattoo maa atụ n'akwụkwọ nsọ - Pastọ Kingsley Okonkwo
Chukwu ji tattoo maa atụ n'akwụkwọ nsọ - Pastọ Kingsley Okonkwo
- Onye dere ya, Michael Ngene na Chinonso Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Pastọ Kingsley Okonkwo bụ onyeisi ụlọụka David's Christian Centre (DCC) akọwaala kpọmkwem ihe mere o jiri see ihe n'ahụ ya nke bekee kpọrọ 'Tattoo'.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso a, Pastọ Kingsley kwuru na ọ bụ oké ịhụnanya o nwere banyere tattoo mere o jiri see ya.
N'okwu ya "Abụ m onye hụrụ tattoo n'anya, enweghịkwa ihe dị njọ banyere ise tattoo maka na Chukwu ji tattoo maa atụ n'akwụkwọ nsọ na Isaiah."
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị ihe ọjọọ ise tattoo iji chọọ ahụ gị mme kama ebe ọ nọ dị njọ bụ mgbe mmadụ malitere ị huta tattoo dịka chi ọzọ.
Pastọ Kingsley kọwakwara etu njem alụmdi na nwunye ya si malite n'afọ 21 gara aga nakwa ọtụtụ ihe njem alụmdi na nwunye kụziere ya.






