Ihe ụwa bịara dịịrị m mfe oge m lụrụ nwunye anọ
Alhaji Aremu Abdulkarim, onye ndu ndị na-egbu anụ lụrụ nwunye anọ, ma kwuo na ndị nwunye ya enyerela ya aka kwalite ahịa anụ ya.
Ọ dị afọ 30 mgbe ọ lụrụ nwunye nke mbụ ya, dịka ọ sịrị na ya enwebeghị nchegharị maka ya ruo taa.
Alhaji Aremu Abdulkarim:
Ihe mere m jiri lụọ ndị nwunye anọ bụ maka na mgbe m nwere naanị otu nwunye, iri nri bụụrụ ihe rara ahụ mana mgbe m lụrụ nwunye nke abụọ, ihe bịara dikwuo mma.
Mgbe ha zuru atọ, ihe niile adị ezigbo mfe.
Ọ bụ ya mere m jiri lụọ nke anọ.
Adị m afọ 110. Atara m ahụhụ oge m ji naanị otu nwunye. Ọ pụọ, m nọro naanị m. Ọ bụ naanị mgbe ọ lọtara ka m na-adị ka di mmadụ.
Nna m lụtaara m ya. Nne m nyere m nwunye m nke abụọ, ebe mụ onwe m jiri aka m lụta abụọ ndị nke ọzọ.
Emere m ya ka m nweeike mụta ọtụtụ ụmụ. Alụrụ m ha ka ha nweeike mụọrọ m ụmụ.
Nwunye nke mbụ:
O nweghị ihe ọjọọ m na-eche n'obi m. Obi m ghere oghe, m nabata ya.
Anabatara m ndị nwunye di m ha. Ọ dị ka anyị abụ ụmụnne, ma anyị na-emeta onwe anyị mma. Obi adịghị m njọ.
O nwere uru ndị dị na ya. Anyị na-erite uru n'aka ibe anyị, ma nke ahụ na-amasị anyị.
Nwunye nke ikpeazụ:
Abụ m nwunye ikpeazụ nke Papa, ma nsogbu ọbụla adịghị.
Abụ m onye na-ere anụ tupu m zute Papa bụ di m.
Site n'amara Chineke, ọ masịrị m oge m hụrụ ya, ma ọ bụkwa ya mere m jiri lụọ ya.
Alhaji Aremu Abdulkarim:
Ihe mere m jiri kwụsị na ndị nwunye anọ bụ maka na m bụ onye Alakụba, ma achọghị m ime karịa ihe Chukwu kwuru.



