Olee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-emetụta mkpebi ntuliaka Naịjirịa n’afọ 2027?
Ọ fọdụrụ ọnwa ole na ole ka mba a mee ntuliaka ọha ọzọ, dịka a maliterela ịchụ nta vootu. Onyeisiala Bola Tinubu na-achọ ịbanye n'ọchịchị nke ugboro abụọ, nke pụtara na ntuliaka a ga-abụ nnwale maka mgbanwe akụnaụba gbapụtara ihe gọọmenti a webatara, ma n'okpuru ọchịchị ya, ọtụtụ ihe agbanweela...
Iji malite, Tinubu wepụrụ ego enyemaaka maka mmanụ ụgbọala, nke a bụ ego gọọmenti naara eji eme ka mmanụ ụgbọala dị ọnụ ala, ma nke a mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa elu ihe ruru okpukpo asatọ.
O metụkwara akwụkọ ego naịra aka, nke mere ka ikike ya daa mba n'ụzọ dị njọ. Ugbua, gọọmenti ya ekwuola na mgbanwe ndị a ebidola ịmịta mkpụrụ, dịka ọ na-adọta ndị na-etinye ego na Naịjirịa.
Mana, n'ebe ezinaụlọ, ọtụtụ ezinaụlọ nọ, ụgbụa ka ha na-ahụta ezigbo ihe mgbu, ọkachasị ndị na-eto eto, bụ ndị mejupụtara ọkara dị ukwuu nke ọnụọgụ ụmụafọ mba a.
I ji maa atụ, n'afọ 2019, ọ bụ ihe dịka ụmụafọ Naịjirịa abụọ n'ime mmadụ ise na-ebi ndụ n'ime ụbịam. Mana ka o ruru n'afọ 2025, ọnụọgụ ahụ rịrị elu ruo mmadụ atọ n'ime ise.
Nke a, ọ pụtara na ndị Naịjirịa ga-echewe ihu n'ebe ọzọ ugbua? Ọ dị mma, ndị na-agba ọchịchị ụkwụ nwekwara nsogbu ndị nke ha ka ọ dị ugbua.
Atụmatụ njikọ n'etiti Atiku Abubakar na Peter Obi akụọla afọ n'ala, nke butere nkewa n'etiti ndị na-agba gọọmenti ụkwụ, ma mee ka ụfọdụ na-ekwu na ndị na-agba gọọmenti ụkwụ ga-eke vootu ha ọzo.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kedụ ndị ọzọ a pụrụ ịhọro?
Ọ dị mma, e nwere ndị ọzọ a ma ama dịka Donald Duke bụbu gọvanọ nakwa onye na-akpọ oku maka ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore nakwa mmadụ 15 ndị ọzọ na-azọ ọkwa ahụ.
Ka o sina dị ugbua, asọmpi a eyiela agha gbara ụzọ atọ n'etiti nnukwu aha ndị a ma ama bụ Tinubu, Atiku na Obi, onye a maara nke ọma n'etiti ndị na-eto eto na ntuliaka gara aga.
Mana, ya na ndị nke ọzọ na-azọ ọkwa a, ha nwereike inweta vootu ndị na-eto eto ugbua ha na-agabiga nsogbu ndị dịka, ajọ ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ enweghị nchekwa na-anaghị akwụsị akwụsị?
Nke a nwereike ịbụ nsogbu kachasị njọ n'oge ntuliaka a. Mwakpo ndị e mere n'ụlọakwụkwọ egosila ka ọnọdụ a siri metụta ụmụaka Naịjirịa, dịka a nụrụ gbasara ọtụtụ ntọrị n'ụlọakwụkwọ n'ime ọnwa ndị a gara aga.
Ibugharị egbe, iyi ndụ egwu na tigbuo zọgbuo ndị ọzọ egbochiela ọtụtụ mmadụ ime njem ma manye obodo dị iche iche ịkwapụ n'ogbe ha gburugburu Naịjirịa.
Ugbua, gọọmenti Tinubu ebuliela ego a na-emefu maka nchekwa, werekwuo ndị ọrụ nchekwa n'ọrụ, bulie ụgwọọnwa ndịagha ma nwetakwa agamnihu gbara ọkpụrụkpụ n'okwu nchekwa, nke gụnyere igbu otu onye ndu, nke otu ndị Alakụba na-eyi ndụ egwu na mpaghara ugwu Naịjirịa nakwa ndịagha ya karịrị otu narị, tinyekwara ntọhapụ ụmụakwụkwọ 44 na ndị nkụzi a tọọrọ n'Ọyọ Steeti, nakwa ihe ndị ọzọ.
Kirie ya n'uju.



