Ihe anyị ma maka otu nwaanyị a sị na e dinara n'ike ma chụba n'ime ajọ ọhịa na Nenwe, Enugu steeti

Mgbe ụmụokoroọbịa na-eti nwaanyị na nwoke ihe

Ebe foto si, Wacol

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu na-ahụ maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị bụ Women Aid Collective (Wacol) etiela mkpu ma katọọ arụ ndina n'ike ha a sị e dinara otu nwaanyị ma taa ahụhụ tụba ya n'ime ajọ nke mere n'obodo Onunkwo Nenwe nke okpuruọọchịchị Aninri dị 'Enugwu Steeti.

N'ozi ha wepụtara na Tuzde 28 Julaị, 2026 kwuru na arụ a bụ ihe na-awụ akpata oyi n'ahụ dịka ọtụtụ mmadụ na-ekiri ka ọ na-eme ma na-akụrụ ndị kpara arụ a aka.

Akụkọ kwuru otu nwaanyị a gbara afọ iri atọ na anọ ma mụọ ụmụ isii bụ onye ya na di ya na-enwekaarị esemokwu ezinaụlọ.

Nke bụ na di ya na-eti ya ihe kwa mgbe kwa mgbe ma na-emerụ ya nnukwu ahụ.

Ndị otu Wacol mgbe ha gara njem nleta n'isiụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu Steeti

Ebe foto si, Wacol

Etu ihe a si mee

N'otu ụbọchị n'ime ọnwa ole ma ole gara aga ka di ya tiri ya ihe ma chọrọ iji mma bepụ ya isi nke mere nwaanyị gbalaa n'ụlọ nne na nna ya.

Mana n'ihi na ha si n'otu obodo, di ya na-aga n'ụlọ nne na nna nwaanyị ahụ ma na-eti ya ihe, sị ya lọghachite n'ụlọ ya.

Nwaanyị ahụ chọpụtara na di ya chọrọ igbu ya ma gbaa ọsọ gbaga n'ụlọ onye agbataobi ha zoo.

Onye agbataobi ahụ duuru nwaanyị ahụ zoo ka di ya ghara ịma ebe ọ nọ.

Mkpa mkpa ọzọ malitere oge di ya na ndị e zoro nwaanyị ahụ n'ụlọ ha gbakọtara aka ọnụ kpọbata ọtụtụ ụmụnwoke ka ha bịa dinaa nwaanyị ahụ n'ike.

Ka ha mechara nke a, ha kpụụrụ nwaanyị ahụ kpụpụ n'ama ebe di ya nọ n'ihu ọha mmadụ wakpoo ma kwasa ya iko n'ihu ọha obodo.

Ndị otu Wacol kọwara na ihe kachasị agba anya mmiri bụ na ụfọdụ ụmụnwaanyị so na-akụ aka, kwere na ihe e mere naanyị ahụ dị ya mma.

Ozi WACOL

Ebe foto si, Wacol

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ kwukwara na ndị a weere mma gbukasịa nwaanyị ahụ n'ahụ, ma weere osisi tie ya na onye agbata obi ọ gbagara n'ụlọ ya ihe

Ndị obodo a mechara buru nwaanyị ahụ tụbaa n'ime ajọ ọhịa dị n'obodo ha ebe ọtụtụ n'ime ha ji ekwe ntị see ihe onyonyo niile merenụ.

Ọ bụzị mgbe nwaanyị ahụ ji anya ọnwụ si n'ajọ ọhia ebe a tufuru ya pụta n'okporoụzọ ka ndị ụgbọala na-agbafe buuru ya bute n'Enugwu.

Ndị Uweojii agaala obodo ahụ ihe karịrị ugboro abụọ gaa kpụrụ ndị niile aka ha dị na arụ ahụ, nke gụnyere di ya, ụfọdụ ndị kwasoro ya iko n'ike, Eze obodo ahụ nakwa ụmụnwaanyị ndị kwadoro ha.

Ụlọọrụ Wacol kwara arịrị na Igwe obodo ji aka ya na-agbapụta ụfọdụ ndị ha kpụgara n'aka ndị Uweojii.

Ha kwuru na arụ ahụ megidere iwu na-achịkwa ikike dịịrị onye nke Enugwu Steeti 2019 ma ṅụọ iyi na ha ga-enwete ikpe kwụụ ọtọ.

Ha jikwa ohere ahụ gwa gọmenti na onweghi onye ma ebe nwoke agbata obi ahụ e tiri ya na nwaanyị ahụ ihe nọ ugbua, ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.

Ka ọ dị ugbua, ha kwuru na nwaanyị ahụ nọ n'agbata ọnwụ na ndụ na-ata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.