Uche Nnaji: Ihe niile merela n'ikpe asambodo adịgboroja

Uche Nnaji yi akwa ọchana okpu ndị ichie

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela Uche Nnaji bụbu Mịnịsta na-ahụ maka Sayesnsị Nka na Ụzụ bụ Uche Nnaji ikike ịga alabekee maka nlekọta ahụike.

Na ntuziaka nke Ọkaikpe nke ụlọikpe ukwu ahụ bụ Jọstịs Joyce Abdumalik nyere Ụbọchị Monde, o kwuru ka e nyeghachi Nnaji akwụkwọ njem ya ma higharịa ikpe ahụ gaa n'abalị 26 nke ọnwa Oktoba,afọ 2026.

Ọkaiwu Ogwu Onoja na-anọchiteanya Uche Nnaji, kwuru na ụlọikpe kpebiri nke a iji nye Uche Nnaji ohere ịga nweta nleta ahụike ya na mba ofesi.

Ụlọọrụ ICPC kpụpụrụ Uche Nnaji ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka nakwa ịrụ akwụkwọ asambodo adigboroja.

A na-enyocha Nnaji banyere asambodo mahadum na akwụkwọ NYSC Nnaji jiri nweta nkwado dịka minista n'afọ 2023.

Nnyocha gbasara akwụkwọ agụmakwụkwọ Nnaji malitere wube n'afọ 2025 mgbe akụkọ gbara na Nnaji ji asambodo adịgboroja nweta ọkwa minista.

Ebubo ọzọ e boro ya bụ na ọ natara ụgwọ ọnwa ruru nde naịra iri abụọ na itoolu na ụma (N29.5m) n'aha iji asambodo adịgboroja nakwa ịtụmgbere ego.