UNGA: Gịnị mere Tinubu agaghị ọgbakọ a ugboro atọ?

Bola Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/X

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Osote Onyeisiala Naịijiria bụ Kassim Shettima edurula ndị ọchịchị gọọmentị Naịjirịa gaa ịnọchite Onyeisiala Bola Tinubu n'ọgbakọ ukwu otu 'United Nations General Assembly'(UNGA) n'a-eme na New York dị n'Amerịka n'izu a.

Afọ a ga-abụ nke atọ ya, anya ahụghị Onyeisiala Tinubu n'ọgbakọ UNGA nke bụ ọgbakọ ndịisiala mba 193 dị n'otu 'United Nations' na-enwe kwa afọ na New York dị n'Amerịka bụ ebe ha na-akpa okwu metụtara mba na mba dịka udo, ikike dịịrị onye nakwa mgbanwe ihu igwe( climate change).

Kassim Shettima

Ebe foto si, Presidency

Nke afọ a, Tinubu zigara bụ Shettima bụ onye du ndị nwere agba nagọọmentị gụnyere Gọvanọ Rivas State bụ Simi Fubara na ogbo ya nke Zamfara bụ Dauda Lawal, ụfọdụ ndị Minista na ndị ọzọ gaa.

Osote Onyeisiala Naịjiria bu Shettima, Gọvanọ Sim Fubara nke Rịvas, Gọvanọ Dauda Lawal nke Zamfara na ndị ọzọ

Ebe foto si, Kassim Shettima

Dịka ụlọọrụ Onyeisiala mara ọkwa na Onyeisiala Bola Tinubu nyere Shettima ntuzaka ịnọchite ya n'ọgbakọ, UNGA, ajụjụ ọtụtụ ụmụ Naijiria na-ajụ bụ gịnị mere na Onyeisiala agaghị ije ahụ n'onwe ya? Kedụ ihe mere na Onyeisiala agabeghị ọgbakọ ahụ ugboro atọ emerela ọgbakọ ahụ n'oge ọchịchị ya?

Gịnị mere anya ejighị hụ Tinubu ugboro atọ n'ọgbakọ UNGA?

Onyeisial Bola Tinubu n'ọgbakọ UNGA n'afọ 2023

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisial Bola Tinubu n'ọgbakọ UNGA nke afọ 2023

Oge mbụ Tinubu gara ọgbakọ UNGA bụ n'ọnwa Septemba afọ 2023.

Ọ gaghị n'afọ 2024, 2025 nakwa 2026 nke mere ọtụtụ ụmụafọ Naijiria jiri kpụru ya n'ọnụ na soshal midia.

Ụfọdụ ha na-ebo ebubo na o metụtara 'egwu' na enweghị ikike ịba Amerịka ma na-arụtụ ka, sị na ọ bụ nwata yụọ ahụrụ, ala achụwa ya ọzọ.

Mana Ụlọọrụ Ọnyeisiala na-ekwu na ihe kpatara ya bụ na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.

Onye enyemaka pụrụ Iche nke Onyeisiala n'okwu ihe na-eme na mba ọzọ bụ Ademola Osodi kwuru na o nweghị ihe rijuru afọ ma onyeisiala hapụ ịga ọgbakọ ahụ dịka o nwegara ihe ndị ọzọ ọ na-eme n'ụlọ nakwa na mpaghara dị iche iche n'ụwa.

Osodi gwara ụlọ ntaakụkọ ChannelsTV na mkparịtaụka sị, "Onyeisiala Tinubu tinyere anya na nsogbu dị n'ụlọ dịka akụnaụba, nchekwa nakwa ọgbakọ mba ndị ọzọ dịkwa mkpa."

N'abalị 13 nke ọnwa Sempeta, Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala Emmanuel macron zutere na Fransị.

Ihe Atiku na ndị mmadụ na-ekwu maka anya ahụghị Tinubu n'UNGA

Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala nke afọ 2027 n'aha otu ADC bụ Atiku Abubakar so na ndị na-ajụ ajụjụ banyere ihe mere Tinubu agaghị ọgbakọ UNGA.

N'ozi o wepụtara n'akara ya n'ọbaozi X,Atiku rụtụrụ aka na ọgbakọ UNGA na abụkarị ohere ndịsiala mba ịkpa etu ha ga-esi adọtara ala ha ego na nnwekọrịta akụnaụba kwuru sị, "Tinubu agaghị eme oche Naijiria n'ọgbakọ kachasị n'ụwa agba na-abaghị uru o nwere ike iziga onye ọzọ gaa, mgbe abụla mgbe."