Anambra kwesịrị ịkwado gọọmenti etiti – Ka Soludo kwuru dịka ọ gara n'ihu ịpịasu Peter Obi

Gọvanọ Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/X

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo akpọọla oku ka ndị Igbo kwado gọọmenti etiti iji keta oke niile ruuru ha na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ gwara ndị Igbo ka ha ghara ikwe ka obi ebere ha kpebiere ha onye ha ga-atụnyere vootu na ntuliaka na-abịa abịa.

Soludo nyere ndụmọdụ a oge ọ gara njem achụmtavootu n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo dị n'Anambra Steeti.

"Lee mbụze na-eme n'okpuru ọchịchị Ekwusigo. Kemgbe onye a malitere igwu ndọrọndọrọ ọchịchị, kedụ ihe o merela gbasara ya"?

"Oge ntuliaka ruo, ị bịa kọọrọ anyị akụkọ, anyị a ka nọrọkwa ebe anyị nọ," ka gọvanọ Anambra Steeti kwuru.

Soludo kọwara mkpa ọ dị ndị Anambra ịgbakọọrọ gọọmenti etiti aka iji nwee ike rite uru nke ọchịchị onye kwuo uche ya.

Dịka Gọvanọ Soludo siri kwuo, "ndị Igbo ga-eketa oke ha na nke ugbua. Anyị ga-eso jee ọgụ ahụ ka Igbo keta oke ha."

Nke a gbadoro ụkwụ na ọ bụ eziokwu na Peter Obi ji ndị mmadụ ụgwọ dịka Gọvanọ maọbụ na o jighị onye ọbụla ụgwọ mgbe ọ chịchara dịka gọvanọ Anambara steeti.

Etu ihe si dị, gọọmenti Anambara steeti na-ebo ebubo na Peter Obi ji ndị mmadụ ụgwọ mana Obi na-ekwu na ebubo ahụ abụghị eziokwu.