Etu nwoke siri si n’ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya na onwe ya n’ala

Aha onyonyo, Etu nwoke siri si n’ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya na onwe ya n’ala
Etu nwoke siri si n’ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya na onwe ya n’ala
Mgbe e biputara ya

Etu a ka ọnọdụ dị mgbe otu nwoke si n'ụlọelu ogogo atọ tutuo ụmụ ya abụọ ma si n'ebe ahụ tụhapụ onwe ya n'ala.

Nke a mere n'okpuru ọchịchị Obingwa dị n'Abia steeti dịka onye agbataobi nwoke ahụ mere ihe a gwara BBC ihe o jiri anya ya hụụ n'ubochi ahụ.

Ọ kọwakwara ọtụtụ agwa dị iche iche nwoke ahụ na-akpa tupu ụbọchị ahụ ọ chọrọ igbu ụmụ ya nakwa onwe ya.

Ndị uweojii n'Abia steeti gwara BBC na ụmụaka nwoke ahụ siri n'ụlọelu ahụ tụtuo anwụghị kama ha nọ n'ụlọọgwụ na-enwete ọgwụgwọ dịka nna ha nọ n'aka ndị uweojii.

Ha sị na ụmụaka ahụ nna ha si n'elu uloelu ogogo abụọ tutuo n'ala ka dị ndụ, nna ha si n'elu daa ka dịkwa ndụ mana ha niile nwere nnukwu mmerụ ahụ.