Amaghị m na m ga-apụta na ndụ - Onye tọrọ n'ala ebe ụlọ dara n'Amaokpala

Aha onyonyo, Amaghị na m ga-apụta na ndụ - Onye tọrọ n’ime ala ụlọ dara n'Amaokpala
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Dịka ọ gachara ụbọchị abụọ nke ụlọ dị ogogo atọ ụmụakwụkwọ bi na ya dara n'obodo Amaokpala dị nso n'ụlọakwụkwọ Oko Politekịnịk, ndị ọrụ gbata gbata ka na-achọ ndị tọrọ n'ebe ahụ.

Cheta na e gwupụtala ozu mmadụ abụọ dịka e kwuru na amabeghị mmadụ ole ihe mberede ahụ metụtara.

Otu nwoke birila n'ụlọ ahụ ihe karịrị otu afọ gwara BBC na ya so na ndị ji ndụ ahụ pụta, kwuru na ọ bụ naanị n'azụ ụlọ ebe ha na-ekute mmiri ka ya hụrụla n'ụlọ ahụ na-agbawa agbawa.

O kwuru na onweghị mgbe onye na-elekọta ụlọ ahụ nke a na-akpọ 'caretaker' n'olu bekee nyere ndị bi ebe ahụ akwụkwọ ka si n'ụlọ ahụ kwapụ dịka akụkọ siri kwuo.

Ihe gọọmenti Anambra steeti kwuru

Ụgbọala Katapila na-abọkasị ụvụrụ aja ụlọelu ahụ dara ada iji zọpụta ndị ka tọọrọ n'ime ya

Gọọmenti Anambra ekwuola na ha ehiwela otu nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdịda ụlọ obibi ụmụakwụkwọ nkeonwe dị nso n'ụlọakwụkwọ Politekịnịk Oko, nke gburu ihe dịka mmadụ abụọ, ebe a na-amabeghị ihe mere ụfọdụ ndị bi ebe ahụ.

Kọmishọna na-ahụ maka mmepe obodo bụ Chijioke Ojukwu, kwupụtara nke a n'ụbọchị Tuzde 28 Julaị 2026 mgbe ụlọmgbasa ozi Channeltv gbara ya ajụjụ ọnụ ma kwuo na ọrụ ndị otu ahụ bụ ịchọpụta kpọmkwem ihe kpatara ọdịda ụlọ ahụ ma gbochie akụkọ ụgha gbasara ihe merenụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị otu ahụ ga-enyocha ụlọ ndị ọzọ nọ na mpaghara ahụ dịka ọtụtụ ndị bi n'ebe ahụ wepụtara ozi banyere ụlọ ndị a na-enyo enyo na ha akwụsighị ike.

Ojukwu kwuru na gọọmentị ga-ahụ na onye ọ bụla a chọpụtara n'aka ya dị n'ọdachi ahụ ga-aga n'ụlọikpe.

Dịka o kwuru, usoro ndị dị otu a ga-ezipụ ozi siri ike ma gosipụta na steeti ahụ a gaghị anabata nleghara anya na ileghara iwu ụlọ anya ọzọ n'Anambra.

E gwupụtala ozu otu nwaanyị na otu nwoke n'ụlọelu ahụ dara n'Amaokpala dị nso n'Oko, Anambara steeti

Mgbe e gwupụtara ozu otu nwoke n'ụlọ ahụ

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Commission

E gwupụtala ozu mmadụ abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị n'ime ụvụrụ aja ụlọelu ogogo atọ ahụ dara n'Amokpala dị nso n'Oko dị n'Anambra Steeti n'abali Sọnde 26 Julaị, 2026.

Nke nwaanyị ahụ bụ onye a kpọrọ Vivian Chinedu dịka ndị enyi ya si kwuo, na ọ ka gụchapụrụ akwụkwọ n'Oko Politeknik na ngalaba 'Department of Food Science and Technology.

Ndị enyi ya kwuru na ọ kwabatara n'ụlọ ahụ n'ọnwa Maachị afọ 2026.

Otu onye bi n'ụlọ ahụ bụ Grace Nweke kọwara na ihe dịka elekere iri nke abalị Sọnde ahụ, na otu onye bi n'ụlọ ahụ gwara ha n'akara WhatsApp na ahụ aja ụlọ ahụ na-adazi ada.

Ihe ndị bi n'ụlọelu ahụ kwuru

Aha onyonyo, Nchọpụta anyị n'ebe ụlọelu dara n'Amaokpala dị nso n'Oko, Anambara steeti

Ndidi Omega bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka gbatagbata n'Anambara steeti bụ State Emergency Management Agency, SEMA kọwara etu ọnọdụ si dị ma kwuo na ha zọpụtara mmadụ atọ n'abalị garaga ma mechaa wepụta ozu otu onye.

BBC ghọtara na a dịla na mbụ tinye akara ịkwatu ụlọahụ n'oge gara aga dịka Onyeisi SEMA si kwuo, mana ihe mere na a kwatubeghị ya ruo na ọ daa ma gbuo mmadụ bụ okwu na-arịọ ọsịsa ya.

Dịka Ndidi Omega, odeakwụkwọ ụlọọrụ gbata gbata Anambra Steeti bụ SEMA si kwuo na otu nwaanyị nwụrụ bụ onye e gwupụtarala ozu ya na o nwekwara ozu otu nwokoroọbịa a hụrụ ka tọọrọ ebe ahụ.

O kwuru na ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na a zọpụtara ndị ọzọ ka ọ n'ime ụlọ ahụ.

Ụlọelu ahụ a kpọrọ Elite Five Star Lodge dị n'akụkụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala nke Tonimas dị n'Amokpala Oko bụ ebe ụfọdụ ụmụakwụkwọ bi nke mmadụ nkịtị nwee.

Ụvụrụaja ụlọ ahụ nakwa ngwongwo ndị mmadụ mebiri emebi

Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo ruru ebe ahụ, o kwuru na nnukwu ihe mere n'ebe ahụ dịka akụkụ niile nke ụlọelu kụrụ afọ n'ala.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị gbanahụrụ ọdachi ahụ kọọrọ ya ihe mere n'abalị ahụ.

"Ụlọelu a bụ ebe anyị bi dara n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde dịka anyị na-akwado ihi ụra.

"Ụfọdụ n'ime anyị nụrụ ụda dịka ọ na-achọ ịda ma gbaa ọsọ gbapụta n'ezi ebe ụfọdụ ndị apụtaghị tupuu ọ daa.

"N'abalị ahụ e bupụtara mmadụ abụọ nke m ji anya m hụụ mana amaghị m ma ha dị ndụ ka ha ọ nwụọla.

"Ụfọdụ ndị ọzọ ka tọọrọ n'ime ụvụrụ aja n'ime ụlọ ahụ."

Akụkọ kwuru na ụlọ ahụ dara n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde ma dagide ọtụtụ ụmụakwụkwọ bi na ya.

Mgbe ụlọelu ogogo atọ dara n'abalị na etu ọ dị mgbe chi foro

Ebe foto si, Anambra Current News

"Ndị ọrụ gbata gbata na-azọpụta ndị mmadụ ugbua"

Etu ụlọelu dị tupu ọ daa

Ebe foto si, Anambra Current News

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga sị na ndị ọrụ uweojii, ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na ndị ọrụ gbata gbata jupụtara n'ebe ahụ iji zọpụta ndị ka tọọrọ n'ụvụrụ aja ụlọ ahụ.

O kwuru na a mabeghi kpọmkwem ọnụọgụgụ ndị ọdachi a metụtara kama na a zọpụtala ụfọdụ ndị merụrụ ahụ dịka a ka na-achọ ndị ọzọ achọ.