Gịnị na-esere ndị mba China na ụmụ Nigeria n'ahịa Trade Fair dị na Lagos steeti?

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe akụkọ pụtara na ndị ahịa na Lagos steeti na-eme ngagharịiwe megide usoro ndị mba China si azụ ahịa n'ime ọdọahịa Balogun dị na Trade Fair Lagos; ọtụtụ na-ajụ ọ bụ gịnị na-ese okwu?.
Ndị Nigeria na-azụ ahịa na-akwazi arịrị ma kwuo na ndị China na-ewepụ ha ọnụ n'ara ma na-emebiri ha ahịa.
Na ngagharịiwe ụmụ Nigeria mere na-efegharị na soshal mịdịa gosiri ebe ndị ahịa na Trade Fair na-akpọ oku dị icheiche ma na-ekwu na ndị China nwereike ịchụpụ ha n'ahịa.
Ha kwuru sị "anyị adịghị asị ndị China laa maka na mmekọ anyị na ha dị anyị mma, kama na ha ebidola imebiri anyị ahịa".
"Anyị adịghị ekwu na anyị na-emebi ọba ahịa ndị China. Onye ọbụla mebiri ihe ndị China ga-akwụ ụgwọ ya".
"Mmekọ anyị na ndị China dị anyị mma mana ha ewetekwala ahịa ha nso n'ebe ahịa anyị nọ".

Ebe foto si, Getty Images
Ụjọ ndị ahịa na Legọs
Ụmụ Naịjirịa na-azụ ahịa kọwara iwe ha nakwa ihe dị icheiche na-atụ ha ụjọ maka etu ndị Chaịna si ere ahịa ma na-azọ ndị bịara ịzụ ahịa .
N'okwu ha "ndị Chaịna bịara nwee ọba ahịa, bido na-emepe ụlọahịa, na-ere ahịa dịka anyị si ere ahịa, anyị ree ahịa ha gaa were akara ekwentị ndị zụrụ anyị ahịa na-akpọ ha n'ekwentị".
"Ha na-akpọrụ ndị na-azụ anyị ahịa nke mere na anyị adịghị erewuzi ahịa".
"Anyị si mba Chaịna tụnata ngwaahịa, ha a na-ere otu ọnụ ahịa ahụ maọbụ ego ole anyị zụrụ ya na Chaịna".
"Ọ bụrụ na ihe a na-eme na-aga n'ihu, a ga-anapụcha anyị ụlọahịa anyị n'oge adịghị anya".
"Anyị chọrọ ịkwụsị nke a, ndị Chaịna ga-enye anyị ohere si n'ime ahịa pụọ ga nọrọ n'ebe teturuaka na-adịchaghị anyị nso, ihe ruru 'pole narị abụọ' n'etiti anyị na ha".
Etu ihe niile si malite
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka akụkọ na-akpọtụ, otu nwoke na-azụ ahịa na Trade Fair na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC sị "ebe e mere ngagharịiwe ahụ na-efesasị ebe niile bụ n'ọdọahịa Balogun dị na Trade Fair, Legọs".
"Mana nke bụ eziokwu bụ na ọbụghị na naanị ahịa Balogun ka nke a na-akpọtụ, ọ na-emekwa n'ahịa dị icheiche gụnyere Alaba International na Madilas dị na Legọs steeti".
"Nsogbu a bidoro oge ndị Chaịna bidoziri na-ewete ikike ịrụ ọba ngwaahịa bekee kpọrọ 'warehouse' tupu ha ebido na-arụ ụlọahịa, ebe ha na-atụmgbere ahịa".
"N'oge gara aga, ụmụ Nigeria na-aga azụrụ nnukwu ahịa n'aka ndị China, ma na-eregharị ya. ndị China adịghị ere ahịa n'ibe n'ibe maọbụ na-ere ahịa otu mkpụrụ otu mkpụrụ, mana ihe ahụ niile agbanweela".
"Ugbua ndị China na-eresi ndị na-azụ ahịa otu ọnụ ahịa ahụ ha na-eresikwa ndị bịara ahịa igoro ihe".
Dịka akụkọ a na-apụta, BBC News Igbo etinyela anya n'ala ịchọpụta ihe na-eme, ihe ndị China na-azụ ahịa na-eme, etu iwu Nigeria si ahụ ya nakwa ihe ngalaba gọọmenti na-enye ndị China akwụkwọ ikike ịzụ ahịa na Nigeria ga-ekwu maka nke a.



























