Ọ bụrụ na m hụ 40% ihe na-eme n'Abia, agaghị m azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi steeti - Ifeanyi Odii
- Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
- Ebeg o si, Legọs, Naịjirịa
- Mgbe e biputara ya
Ifeanyi Chukwuma Odii na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi steeti na ntuliaka 2027 ekwuola ihe kpaliri mmụọ ya ịzọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ.
Ifeanyi Odii gwara BBC Igbo na, "Ọ bụrụ na m hụ 40% ihe na-eme n'Abia steeti n'ebonyi steeti, aga m agwa aka na-achị Ebonyi ugbua ka ọ gaa n'ihu mana nke bụ eziokwu bụ na ahụghị m 10%".
O kọwara ụfọdụ ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntuliaka a.
"Abụ m onye kwenyere na ọchịchị kwesịrị ịbụ maka iweta mgbanwe ndị obodo, ọ bụ ya mere m ji achọ ịzọ ọkwa Gọvanọ iji weta mgbanwe n'Ebonyi steeti ma chụọ ụbịam ọzọ ụkwụ eru ala na steeti anyị", ka o kwuru.
Ifeanyị Odii na-azọ ọkwa na pati Peoples Democratic Party (PDP), kọwara ihe mere o ji azọ ọkwa na pati PDP nakwa otu ihe gbara ọkpụrụkpụ gọọmenti ya ga-eme n'ime ọnwa atọ ọ banyere n'ọchịchị.
"Ugbua abụghị oge ọ bụ pati na-azọ ọkwa, ọ bụ ihe i mepụtara ga-eme ka ndị mmadụ tụnyere gị vootu, nke a bụ maka na usoro ntuliaka agbanweela na Naịjirịa".
"N'ime ọnwa m ga-anọ nọ n'ọchịchị, agaghị enwe onye Ebonyi steeti ọbụla ị ga-ahụ n'okporoụzọ na-ere ihe".
Maka agụmakwụkwọ, okwu banyere ikwalite ụmụnwaanyị, Ifeanyi Odii kwuru na ụmụnwaanyị ga-emejupụta 40% na ndị ga-eso ya rụọ ọrụ ma ọ bụrụ na o nweta mmeri na 2027.
Ọ kọwara na kemgbe afọ 21 gara aga, ọ rụọla ọtụtụ okporoụzọ, nye ohere agụmakwụkwọ n'efu, ụlọ obibi ma nye ọtụtụ puku kwuru puku ndị Ebonyi steeti nkwado ma kwuo na ọ bụrụ na ọ bụrụ Gọvanọ, ọ ga-eme karịa ihe ndị o megoro.
Maka nchekwa nakwa mwakpo a na-enwe n'ime obodo dị iche iche n'Ebonyi steeti, Odii kwuru na ọ bụ oke agụụ na-akpata ya.
"Ọ bụrụ na a chụọ agụụ ọsọ n'obodo, agaghị enwe mwakpo ndị a n'obodo ọbụla n'Ebonyi steeti". ka Odii kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmenti ya ga-agbanwe echihce ndị Ebonyi ọkachasị ndị ntorobịa, nye ha nkwado zuruoke nakwa ọrụ, kwalite ọnọdụ azụmahịa ndị Ebonyi ma hụ na ọnọdụ Ebonyi steeti gbanwere ma bụrụ steeti e ji ama atụ na Naịjirịa niile.



