Bishop Alexander Ibezim akọwala ihe mere o jiri kpụpụ Primate ụka Anglican ụlọikpe

Foto Bishop Alexander Ibezim na Primate ụlọụka Anglican bụ Most Rev. Henry Ndukuba
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Archibishop Alexander Ibezim bụ Archbishop ụlọụka Anglican nke mpaghara Niger nakwa Bishop nke Awka Diocese ekwuola kpọm kwem ihe mere o jiri kpụpụ onyeisi ụlọụka Anglican na Nigeria nakwa na Dean nke ụka ahụ n'ụlọikpe.

Nke a na-abịa dịka akụkọ fesara ebe nille na onyeisi (Primate) ụlọụka Anglican na Nigeria bụ Most Rev. Henry Ndukuba nyere ntuziaka ka Archbishop nke mpaghara Niger nakwa Bishop Awka Diocese bụ Most Rev. Alexander Chibuzor Ibezim ka ọ gaa ezumike ọnwa isii.

BBC mere nnyocha ma chọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ a dịka ọtụtụ akụkọ na-efegharị ebe niile banyere nkwụsị ọrụ a kwụsịrị Archibishop Alexander Ibezim.

Anyị kpọtụrụ otu onye ọkaiwu na-anọchiteanya Archibishop Alexander Ibezim na-achọghị ka a kpọ aha ya, onye kọwaara anyị na ọ bụ eziokwu na Archibishop Ibezim kpụpụrụ Primate ụlọụka Anglican n'ụlọikpe.

Foto Bishop Alexander Ibezim

Ọ kọwara na dịka iwu ụlọụka Anglican si kwuo, Primate enweghị ikike ọbụla ịkwụsị Archibishop Alexander Ibezim maọbụ Archibishop ọbụla ọzọ ọrụ.

"Ọ bụ naanị ọgbakọ 'General Synod' nwere ikike ịkwụsị Archibishop ọbụla ọrụ", ka o ọkaiwu ahụ kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na o doro anya na ọ bụ ndị na-akpa nkata ka e wepụ Archibishop Ibezim n'ọkwa dịka bụ ihe na-ebo ya ebubo dị iche iche.

O gwara anyị na Archibishop Ibezim nwetara kepụ kepụ na a chọrọ ịkwụsị ya ọrụ ma gakwuru ụlọikpe iji nweta akwụkwọ ikike ga-egbochi nke a n'ụbọchị Tuzde 13 Ọktoba, 2026 ma kwuo na onyeisi ụlọụka Anglican bụ Most Rev. Henry Ndukuba ekweghị anabata akwụkwọ mgbochi ahụ ụlọikpe nyere ha.

Ma kwuo na ọ bụ ya mere onyeisi ụlọụka Anglican ji kwuo na ọ bụ n'ụbọchị Tuzde 13 Ọktoba 2026 ka o nyere ntuziaka ka Archbishop Ibezim kwụsị ọrụ.

N'okwu ya "A na-agba Archbishop Ibezim mgba a niile iji hụ na e wepụrụ ya n'ike iji tinye onye ọzọ dịka Archbishop nke mpaghara Niger".

Ọkaiwu ahụ kwuru na ka ọ dị ugbua, ebubo ahụ niile e boro Archbishop Alexander Ibezim abụghị eziokwu.

Ihe mere ụlọụka Anglican Nigeria jiri kwụsị Bishop Alexander Ibezim nke Awka Diocese ọrụ ruo ọnwa isii

Njirimaara ụlọụka Anglican na Nigeria nakwa Bishop Alexander Ibezim yi uwe ndị Bishop

Onyeisi ụlọụka Anglican na Nigeria bụ Most Rev. Henry Ndukuba enyela ntuziaka ka ArchBishop nke mpaghara Niger nakwa Bishop nke Awka Diocese bụ Most Rev. Alexander Chibuzor Ibezim ka ọ gaa ezumike ọnwa isii n'ihi ebubo ndị e boro ya na nnyocha ndị na-aga n'ihu na Diocese ya.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na 13 Ọktoba 2026 ebe Onyeisi Anglican kwuru na mkpebi si na ntuziaka otu e hiwere eleba anya n'ihe na-eme na Diocese ahụ, ọkachasị ndị si esi bata nke Dean ụka Anglican na Nigeria nọ n'isi ya.

Ozi ahụ kwukwara na mkpebi ahụ gbadokwara ụkwụ na nzukọ Primate na Bishop Ibezim nwere n'ụbọchị 9 Ọktoba 2026 bụ ebe a gwara ya maka mkpebi otu nnyocha ahụ.

O kwuru na nkwụsị n'ọrụ a bụ maka iji hụụ na e mere nnyocha kwụụ aka ọtọ n'ebubo ndị e boro Bishọp Ibezim, ma weghachite udo nakwa ịdị n'otu na Diocese ahụ.

Primate kwuru na mkpebi ahụ bụ nke ndịisi ụka mere na ọ bụghị ntaramahụhụ, gbagide ụkwụ n'iwu ụlọụka ahụ bụ 'Section 29(1) of Chapter V of the Constitution and Canons of the Church of Nigeria nke afọ 2020.

Ozi ahụ họpụtara Bishop nke Aguata Diocese bụ Rt. Rev. Samuel Ezeofor dịka onye nlekọta Awka Diocese nakwa Bishop nke mpaghara Niger n'oge e nyere Bishop Ibezim ezumike a.

E nyekwara Bishop Ibezim iwu ka o were ihe ọrụ ya niile nyefee n'aka Bishop Ezeofor ngwa ngwa ma sị ka ọ ghara ịghazi ofufe ọbụla maọbụ ihe ọbụla a na-eme na mpaghara Niger nakwa Awka Diocese dịka ọ nọ ezumike a.

Nkwụsị n'ọrụ ọnwa isii ahụ ga-adị ire mana e nwere ohere ileba ya anya gbatịkwuo maọbụ belata ya dịka Primate si kwuo.

Kedụ ebubo ndị e boro Bishop Ibezim?

N'ozi ahụ si n'aka Primate ụlọụka Anglican nke Nigeria, a kọwaghị kpọmkwem ihe bụ ebubo ndị e boro Bishop Ibezim mana ha kwuru na aha dị n'etiti ọtụtụ e bubo ndị aṅaa nke na-ebutere ụlọụka Anglican mmechu ihu.