Toluwanisings: Etu ndị ezinaụlọ, ndị enyi na ikwu na ibe si eru uju maka ọnwụ otiegwu a

Foto Toluwanisings
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ezinaụlọ, ndị enyi na ikwu na ibe otiegwu Olayemi Bayonile onye a maara dịka Toluwanisings ekwupụtala mwute ha banyere ọnwụ ya.

Nke a na-abịa adị ezinaụlọ ya wepụtara ozi na soshal midia ma kwo na ọ bụ eziokwu na Toluwanisings nwụrụ n'ụbọchị Wenezde 14 Ọktoba 2026.

Ndị enyi Toluwanisings gụnyere Bidemi Olaoba, Nikki Laoye, Wumi Toriola, Adeyinka Alaseyori, Woli Agba, Dare Justified na ọtụtụ ndị ọzọ wepụtara ozi ma kwuo na ọnwụ Toluwanisings gbawara ha obi.

Ozi ezinaụlọ Toluwanisings wepụtara kọwara nwaamadị a dịka ezigbo di nye nwunye ya ma bụrụkwa onye ji obi ya niile eti egwu na-enye Chukwu otito.

Ha gara n'ihu rịọ ka ọhanaeze tinye nwunye ya, ezinaụlọ na ndị ikwunaibe ya n'ekpere n'oge oke ihe iru uju a.

Ozi ahụ ahụ gara n'ihu kwuo na a ga-ewepụta ozi banyere olili ozu ya mgbe oge ya ruru.

Onye bụ Toluwanisings na-agụ egwu ụka a sị na ọ nwụọla?

Toluwanisings yi uwe na-acha ọlaedo jiri igwe e ji ekwu okwu n'aka na-abụ abụ

Ndị Nigeria abanyela n'ekpere n'isi otu nwokoroọbịa na-eti egwu ụka bụ Olayemi Bayonile e ji Toluwanisings maara dịka akụkọ na-ewu na soshal midia kwuru na ọ nwụọla.

Nke a na-abịa dịka otu onye ọkaiwu a ma ama bụ Pelumi Olajengbesi dere n'Instagram ya @pelumi.olajengbesi: "Chineke m! Kedụ ihe ndụ a bụ! Mba, Chineke! Anyị na-arịọ maka ebere gị n'isi Toluwanisings.

"Ọ na-ewute m maka ọnwụ ndị ntoroọbịa. Nke a abụghị ebumnobi Chineke nye anyị. Anyị na-asị mba nye ọnwụ erughi eru"

Dịka Olajengbesi dechara nke a, onye na-akpa ọchị na ma na-etikwa egwu ụka bụ Ayo Ajewole e ji Woli Agba kwuru ka ndị mmadụ ghara ikpebi na ha ga-elekwasị Chineke anya.

Ọtụtụ ndị mmadụ malitere ikpe ekpere ka akụkọ na Toluwanisings ghara ịbụ eziokwu. BBC achọpụtabeghi ma nwamadị a ọ nwụọla n'ezi ya maọbụ na ọ ka nọ n'ụlọọgwụ.

Onye bụ Toluwanisings?

Toluwanisings yi uwe na-acha ihu eluigwe

Toluwanisings bụ nwafọ Nigerian na-agụ egwu ụka, na-edekwa ede ma bụrụkwa onye ji egwu agbasaozi ọma. Ezi aha ya bụ Olayemi Bayonile Bolaji.

A ma ya ama n'ụdịrị ikike ọ na-eji agụ egwu ọkachasị abụ otito n'asụsụ Yoruba.

N'ihi etu egwu ya si pụọ iche maka na ọ na-akwakọta egwu ọdịnala na egwu ụka nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-ege egwu n'ịntanetị nakwa soshal midia nke ukwuu.

Na Julaị afọ 2026, Toluwanisings na ndị otu egwu ya gbanahụrụ ọnwụ n'ihe mberede nke okporoụzọ mgbe ụgbọala bus bu ha na ụgbọala ukwu trailer sọkọtara isi, ebe ha si iti egwu na-alọta.

O kwupụtara maka nke a n'Instagram, tinye foto ya iji gosi ụgbọala ha mebiri emebi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị