Onye bụ Stella Okunna, nwanyị mbụ bụ ọkammụta na ngalaba agụmaakwụkwọ mgbasaozi na Naịjirịa?

Ebe foto si, Stella Okunna
Ọkammụta Chinyere Stella Okunna bụ otu n'ime ụmụnwaanyị mepere ụzọ ọhụrụ n'akụkụ agụmakwụkwọ mgbasa ozi a kpọrọ 'mass communication' na Naịjirịa.
A ma ya dịka nwaanyị mbụ ghọrọ Ọkammụta n'ọmụmụ 'Mass Communication' na Naịjirịa, bụ nzere o nwetere n'afọ 2001.
Agụmaakwụkwọ ya

Ebe foto si, Stella Okunna
- A mụrụ Okunna n'obodo Uga, n'okpuruọchịchị Aguata n'Anambra steeti.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa Nsụka (UNN).
- Ọ gara n'ihu nweta nzere Master's ya na Mahadum Leicester dị na mba Briten.
- O mechakwara nweta PhD ya na Mahadum Lagos (Unilag).
Njem ya n'ụwa agụmakwụkwọ
- Ọ malitere ọrụ nkuzi ya na Institute of Management and Technology (IMT), Enugu.
- N'afọ 1994, o gara Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka (UNIZIK), ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa.
- N'afọ 2001, o nwetara ogo Prọfesọ, bụrụ nwaanyị mbụ n'akụkọ ihe mere eme na Naịjirịa n'isi ọmụmụ 'Mass Communication'.
- Ọ nọgidirị dịka naanị nwaanyị ruru ogo Prọfesọ n'isi ọmụmụ 'Mass Communication' na Naịjirịa ihe ruru afọ iri na abụọ (12), tupu nwaanyị ọzọ na-akụzi ihe enweta ogo a.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba 'Mass Communication' site n'afọ 1998 ruo 2006, nakwa site n'afọ 2014 ruo 2017.
- Okammụta Stella Okunna bụkwa nwaanyị mbụ ghọrọ Dean nke 'Faculty of Social Sciences' na Mahadum Nnamdi Azikiwe, ebe ọ rụrụ ọrụ nlekọta ahụ site n'afọ 2016 ruo 2019.
Ọrụ ndị ọzọ nwada Stella na-arụ

Ebe foto si, Stella Okunna
Okammụta Stella Okunna abụghị naanị onye nkuzi na mahadum.
- Site n'afọ 2006 ruo 2014, ọ rụrụ ọrụ n'ọchịchị Anambra steeti n'oge ọchịchị Peter Obi, ebe ọ jere ozi n'ọkwa dị iche iche:
- Ọ bụbu Kọmishọna na-ahụ maka Ihe gbasara ozi na omenala.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka atụmatụ akụ na ụba nakwa nkesa ego.
- Ọ bụrụkwa onyeisi ọrụ n'obi ọchịchị steeti ahụ.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nhazi n'etiti gọọmentị na ndị otu na-akwado mmepe obodo.
Ihe ndị ọzọ mere nwada Stella jiri gbapụta ihe

Ebe foto si, Stella Okunna
Mana ịbụ onye mbụ ghọrọ Ọkammụta na ngalaba 'Mass Communication' abụghị naanị ihe mere nwada Stella Okunna ji bụrụ onye a ma ama.
N'ime ọtụtụ afọ ọ nọrọ n'ọrụ nkuzi, ọ zụlitela ọtụtụ ndị ntaakụkọ, ndị na-arụ ọrụ mgbasa ozi na ndị ọkachamara n'ụlọakwụkwọ.
Ọtụtụ n'ime ndị o kụziiri agaala n'ihu bụrụ ndị nkuzi na mahadum, ndị ntaakụkọ na ndịisi n'akụkụ ọrụ mgbasaozi.
Akụkọ banyere ndụ Ọkammụta Stella Okunna bụ nke nwaanyị banyere n'akụkụ ọrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị na-adịbeghị mbụ ma rute n'ọkwa kachasị elu.
Ọ bụghị naanị na ọ ghọrọ onye mbụ, mana njem ya nyere aka mepee ụzọ ka ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ nwee ike isonye.




























