Etu e si jiri AI kewaa ụmụ ejima isi ha tapagidere

Aha onyonyo, Etu e si jiri AI kewaa ụmụ ejima isi ha tapagidere
Etu e si jiri AI kewaa ụmụ ejima isi ha tapagidere
Mgbe e biputara ya

E ji enyemaka AI waa ụmụ ejima dị ọnwa iri na itoolu isi ha tapagidere ahụ.

Ugbua, ha na-ebi ndụ ha dịka ha na-akwado iru afọ atọ.

Ụlọọrụ Gemini Untwined kwuru na a mụrụ Mercy na Goodness n'Ekiti steeti n'ọnwa Juun 2023. Ha kwuru na isi ha tapagidere nke mere ka ha abụọ jiri otu ọbụrụ dị ndụ.

Oge ha ruru ọnwa isii, e nyefere ụmụ ejima ahụ n'aka Ọkammụta Noor ul Owase Jeelani onye bụ dọkịnta ụmụaka n'ụlọọgwụ Great Ormond Street Hospital ma bụrụkwa onye hiwere Gemini Untwined.

E kwuru na a wara ụmụaka ahụ ugboro anọ nke nwere awa iri anọ n'ime ọnwa anọ.

Ndị ọrụ ahụike ruru iri isii si mba iri abụọ dị iche iche rụrụ ọtụtụ ọnwa iji kwadoo maka emume ikewa ụmụ ejima ahụ site n'iji AI.

Ịwa ahụ ikepazụ a wara ha n'ụlọọgwụ Sheikh Khalifa Medical City dị n'Abu Dhabi Ọkammụta Jeelani na ndị dọkịnta iri na abụọ ndị ọzọ, nwere awa iri na abụọ.

N'okwu Dọkịnta Owase Jeelani bụ onye hiwere Gemini Untwined "Oge ị na-ekewa ụmụ ejima tapagidere onwe ha n'ebe dị iche iche, ị na-eme ka ụbụrụ ha gbaa n'anwụ n'elu tebụlụ e ji awa ahụ, mana ohere e nwereike iji butere ụbụrụ ihe mmerụahụ dịkwa ya maka na anyị ahụtala ya n'oge ndị gara aga.

O kwuru na ụzọ kachasị mma e si awa ahụ bụ ime nkewa ahụ na-ebuteghị ihe mmerụahụ ọbụla nye ụbụrụ niile ma kọwaa na mpụtaihe a kwalitere akwalite, mpụtaihe teknụụzụ a gwakọtara agwakọta, ọ na-ebugo ya n'ogogo dị elu.

Ụmụaka ahụ adịla mma dịka ha na-akwado ịgba afọ atọ.