Ndị uweojii Zamfara anwụchiela onye Alakụba yiri egwu igbu ndị ụka Christ

Ndị uweojii anwụchiela onye Alakụba yiri egwu igbu ndị ụka Christ na Zamfara
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị uweojii Zamfara state anwụchiela otu nwaokoroọbịa maka ebubo ikwe ukwe na-akpọ oku ka e gbuo ndị ụka Christ n'onyonyoo fesara ebe niile n'izuụka gara aga.

Onyonyoo ahụ gosiri ebe nwaokoroọbịa ahụ a na-enyo enyo yi uwe njirimara ndị otu Jama'atu Izalatil Bidi'a Wa'ikamatus Sunnah (JIBWIS) nke ngalaba Zamfara, ya na ụmụakwụkwọ nke ụlọakwụkwọ ndị Alakụba abụọ nọ n'okpuru ọchịchị ime obodo Maradun.

Ndị otu JIBWIS jidere nwaokoroọbịa ahụ aha ya bụ Umar Ibrahim Gandi Maradun tupu ha enyefee ya n'aka ndị uweojii maka nnyocha.

Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tuzde 27 Ọktoba 2026, Kọmịshọna ndị uweojii na Zamfara state bụ Muhammad Bello kwuru na ndị ọrụ ya dị njikere ichekwa mmadụ niile na-agbanyeghị okpukperechi ha.

Ndị uweojii sịrị na ụfọdụ ihe e kwuru n'onyonyoo ahụ bụ "bunye anyị egbe ka anyị gaa gbagbuo ndị na-eso ụzọ Christ."

Dịka ndị uweojii siri kwuo, nnyocha ha merela chọpụtara na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde 23 Ọktoba, 2026 ka e sere onyonyoo ahụ n'oge Ibrahim Gandi nọ n'ụzọ na-aga n'ụlọ okpukperechi Aliyu Ibn Abi Thalib Mosque.

Ụlọakwụkwọ abụọ a hụrụ n'onyonyoo ahụ bụ Nurul Islam Islamiya na Akidatul Sahiha Islamiya nọcha n'okpuru ọchịchị ime obodo Maradun.

CAN akatọọla oku ikpochapụ ndị ụka Christ n'Enugu na Jos ma kwuo ka a malite nnyocha

CAN akatọọla egwu a na-eyi ikpochapụ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’Enugu na Jos, kpọọ oku ka amalite nnyocha

Otu jikọtara ndị na-eso ụzọ Kraịst na Nigeria bụ Christian Association of Nigeria (CAN) akatọọla onyonyoo gosiri ebe otu nwaokoroọbịa ji ukwe na-akpọ oku ka e bunye ha egbe AK-47 iji wakpoo ndị na-eso ụzọ Kraịst n'Enugu nakwa Jos mgbe ha na-efe ofufe n'ụbọchị Sọnde.

CAN kọwara ya bụ iyi ndụ egwu dịka nke na-awụ akpataoyi na nke na-ekwesịghị ekwesị, dịka ha gbara isi akwara na e kwesịghị ịkpagbu maọbụ busoo nwaafọ Nigeria ọbụla agha n'ihi nkwenye na okpukperechi ya.

N'ozi Onyeisi otu CAN bụ Archbishop Daniel Okoh wepụtara n'ụbọchị Tuzde 27 Ọktoba 2026, otu ahụ gosiri mwute maka etu e siri mee ka ụmụaka na ndị na-eto eto sonye n'ụdị ukwe ahụ, ma dọọ aka na ntị na nke a nwereike inwe nnukwu ọghọm.

Okoh kwuru na e kwesịghị ịhụta ụdịrị iyi egwu dị etu a ka mkpọtụ ndị ntoroọbịa, kama ka e lebara ya anya dịka okwu dị oke mkpa.

CAN kpọrọ oku ka ndị ọrụ nchekwa DSS, ndị uweojii Nigeria na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ mee nnyocha miri emi gbasara onyonyoo ahụ.

Ha rịọkwara ka ndị nchekwa chọpụta oge nakwa ebe a nọrọ see onyonyoo ahụ, chọpụta ndị so n'onyonyoo ahụ, ma chọpụtakwa ma o nwere mmadụ maọbụ otu ọbụla kwadoro ha n'ụzọ ọbụla.

CAN gwara ndị ọrụ nchekwa ka ha nyochaa ihe iyi ndụ egwu niile onyonyoo ahụ nwereike ibute, ma hụkwa na ha zọpụrụ njem ngwangwa iji chekwaa ndị na-eso ụzọ Kraịst na ụlọụka niile dị n'Enugu, Jos nakwa akụkụ Nigeria dị iche iche.

N'ozi ahụ, Archbishop Daniel Okoh sịrị na ọ bụ eziokwu na ha anụla na onyendu Jama'atu Izalatil Bid'ah Wa Iqamatis Sunnah (JIBWIS) agọpụla otu ya n'onyonyoo ahụ, mana ọ dị mkpa na e mere nnyocha kwuuru onwe ya iji chọpụta ọnọdụ butere ukwe ahụ.

CAN kpọrọ oku ka ndị ndu okpukperechi niile jụ ịnabata nkụzi na omume ndị na-akwalite mkpọrọmaasị maọbụ tigbuo zọgbuo megide ndị otu okpukperechi ọzọ, dịka ha gbara gọọmenti ume ka o mee ihe doro anya iji gosi na ha anaghị akwado mmekpaahụ ndị gbakwasịrị ụkwụ n'okpukperechi.

CAN gwara ndị na-eso ụzọ Kraịst ka ha gaa n'ihu dere duu, mụrụ anya ma na-erubeisi n'iwu, ma zerekwa ime ihe ọbụla ga-eme ka ọnọdụ a kawanye njọ.

Ka ọ dị, CAN kpọrọ oku ka e kpee ndị niile a chọpụtara na aka ha dị n'ịkwalite ọgbaaghara megide ndị na-eso ụzọ Kraịst ikpe dịka ọ dị n'iwu.

Amnesty agwala gọọmenti Nigeria ka ha nyochaa ebubo ịkpọ oku iyi ndị ụka Christ egwu

Otu ahụ kpọrọ oku ka ndị ọchịchị Nigeria chọpụta ebe onyonyoo ahụ si, ebe e sere ya nakwa ndị so na ya.

Otu 'Amnesty International' akpọọla oku ka gọọmentị Nigeria mee nnyocha banyere onyonyoo na-efegharị n'ịntanetị bụ nke gosiri ụmụaka na ndị ntoroọbịa na-akpọ oku iyi egwu na ime ihe ike megide ndị uka Kraịst na Enugu nakwa Plateau state.

Onyonyoo ahụ nke fesara n'ụbọchị Sọnde n'akara Facebook nakwa X, gosiri oge otu nwoke, ụmụaka na ndị ntoroọbịa yi uwe nke e jiri mara ndị otu Alakụba a mara nke ọma dịka Jama'atu Izalatu Bidi'a wa'iqamatus-Sunnah (JIBWIS) na-agụ egwu iyi egwu.

Amnesty International kwuru ne egwu ahụ na-akpọ oku ka e weta "egbe AK-47 iji wakpoo ndị na-ekweghị na okpukperechi ha n'ụbọchị Sọnde na Enugu nakwa Jos..."

N'ozi Amnesty International wepụtara na Mọnde, 26 Ọktoba 2026, ha kọwara omume ahụ dịka ihe na-atụ egwu, nke na-egosi etu e si enye ụmụaka ozi na-akwalite ime ihe ike na ịkpọasị okpukperechi.

Otu ahụ kpọrọ oku ka ndị ọchịchị Nigeria chọpụta ebe onyonyoo ahụ si, ebe e sere ya nakwa ndị so na ya.

O kwukwara na ọ dị mkpa ka ha nyochaa ihe omume na ihe ọmụmụ a na-eji azụlite ụmụaka nọ n'otu ahụ.

Otu ahụ kpọkwara oku ka e chekwaa ụmụaka ndị so na mmemme ahụ iji wepụ n'echiche ha site na-ime ihe ike n'obi ha, ma nyere ha aka kwesịrị ekwesị n'ihe gbasara ahụike uche na agụmakwụkwọ.

Amnesty International rụtụrụ aka na iwu Nigeria na iwu mba ụwa nyere gọọmentị ọrụ ichekwa ụmụaka site n'ihe ike, okwu ịkpọasị na itinye ha n'ọzụzụ agha maọbụ nke yiri agha.

Iwu ndị ahụ gụnyere 'Child Rights Act' na Nkwekọrịta Mbaụwa maka ikike Ụmụaka nke mba ndị dị n'otu.

Otu ahụ dọrọ aka na ntị na iji mmemme okpukperechị maọbụ nke ndị ntoroọbịa akụzi echiche iro n'obi ụmụaka nwere ike itinye nchekwa ha, agwa ha na ọdịnihu ha n'ihe egwu.