Ụmụnwaanyị na-abanyewa n’ahịa ejiji a ma ama nke Ariaria Aba

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị na-abanyewa n’ahịa ejiji a ma ama nke Ariaria Aba
Ụmụnwaanyị na-abanyewa n’ahịa ejiji a ma ama nke Ariaria Aba
Mgbe e biputara ya

Ọtụtụ ụmụnwaanyị amalitela ịbanye n'ọrụ aka nakwa azụmaahịa nke ọ bụkarịrị ụmụnwoke nọ na ya. Ụmụnwaanyị ndị a bụ ndị ọrụ ha na-apụtazi ihe nke ukwuu na-emesi ihe ike bụ nke na-atụ ndị mmadụ n'anya.

Na mkparịtaụka ụlọmgbasa ozi BBC na ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a nwere ka ha kọwara ije ha nakwa uto ha n'ọrụ ha dị iche iche.

Adaora Okeke kwuru na ya bụ onyeisi ụlọọrụ Bespoke Craft kwuru na ya na-arụpụta akpụkpọụkwụ, ma nke ụmụnwoke ma nke ụmụnwaanyị.

Ọ kọwara na ọrụ ya adịghị mfe oge ya malitere maka na ọ bụ ọrụ e ji mara ụmụnwoke, tinyekwara ahịa.

Dịka o kwuru, "Onye niile nọ ebe ahụ bụ nwoke. Ebe m natara ọzụzụ bụ n'ahịa Arịarịa dị n'Aba. N'Ochendo. Oge m na-amụ ọrụ a, ebe m nọ bụ ebe ụmụnwoke jupụtara. Ma n'ihi na Enocentric kpọkọtara ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị soro m mụọ ọrụ a, ọ raghị m ahụ nke etu ahụ, mana ndị nọ n'akụkụ, ndịahịa ekwenyeghị na nwaanyị nwere ike ịmụ ọrụ a maọbụ na nwaanyị nwereike ịmụta ọrụaka a.," ka o kwuru.

Ọzọ dịka ya bụ akụkọ onye na-akwa akwa bụ Emmanuel Ezinne bụ onye kwuru na akụkọ nke ya abụghị obere akụkọ.

"Amalitere m n'ime obere ụlọ, n'ime obere ụlọ m n'oge ahụ. Oge ahụ enweghị m igwe e ji akwa akwa maọbụ ihe ọbụla ga-enyere m aka maọbụ gbaa m ume. Ọ bụ naanị otu m naara papa nnukwu m, nke a nọ m n'akụkụ ugbua."

Ọ gara n'ihu kwuo ihe mere o jiri chọọ ịmụ ka e si arụ akpụkpọụkwụ bụ maka iji mee ka ọdịnihu ya dị mma nakwa iji nyere onwe ya aka maka ọnọdụ ya nọ n'ime ya ugbua.

"Site n'enyemaka soshal midịa, ọkachasị TikTok, maka na aghọtara m TikTok nke ọma karịa Instagram, ọtụtụ ndị mmadụ amatala m site n'onyonyoo ndị m na-ezipụ. Ugboro abụọ maọbụ atọ ka m nwetara ozi ndị gazuru ebe niile," ka o kwuru.

Ezinne kọwara na "Ihe mere m ji rute n'ogogo a ugbua, maka na agwara m gị na ọ bụ n'ime ụlọ m ka m na-anọ akwa akwa. FFP nyeere m aka nke ọma. Mgbe m zutechara ha, m bidozie na-arụpụta ihe nke ọma, maka na ndị a kpọnyere anyị ka anyị zụọ,"