Etu m si akụziri ụmụaka nwere nkwarụ ka ha kwụrụ n'onwe ha

Aha onyonyo, Etu m si akụziri ụmụaka nwere nkwarụ ka ha kwụrụ n'onwe ha
Etu m si akụziri ụmụaka nwere nkwarụ ka ha kwụrụ n'onwe ha

Elsie Akerele, onye bidoro ebe obibi Lady Atinuke Oyindamola Memorial Home, akpọkuola ọhanaeze ka ha kwụsị nleghara anya na ịkpaoke n'ebe ụmụaka nwere nkwarụ nọ.

Elsie kpọrọ oku ahụ n'ajụjụ ọnụ ya na BBC News Igbo ebe ọ nọ kwuo na ụmụaka ndị a abụghị ibu arọ, kama ha bụ "mmadụ e kwesịrị inye ịhụnanya, nkwanye ùgwù, na nnabata."

N'onyonyo ka ka Akerele kọwara etu njem ya n'ọlụ enyemaka maọbụ etu o si malitere.

Ọ sị na ya bidoro ọlụ a mgbe nwa ya nwaanyị bụ Atinuke nwetara mmerụ ahụ n'isi mgbe ọ bụ nwatakịrị, nke mechara kpatara ya ọrịa akwụkwụ siri ike ka afọ iri na abụọ gachara.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ mụrụ nwa nwoke aha ya bụ David, onye nwere ọrịa 'Autism', 'Cerebral Palsy', na 'Down Syndrome'—nke ọ kpọrọ nkwarụ "atọ n'ime otu."

"Mgbe a chọpụtara ọrịa ndị a, ụwa gbakụtara anyị azụ" ka Akerele kọrọ.

Ọ sị na "ndị agbataobi gbara anyị gburugburu jụrụ nwa m, ma n'ụlọụka, ọ dịghị onye chọrọ ịnọ ya nso".

"A gbanwere m, bido ichebe nwam n'aka mmetọ na nleghara anya ọha."

N'ihi ihe mgbu ndị a, Akerele gara mụọ banyere ahụike uche na ọrịa akwụkwụ n'ụlọọgwụ Yaba.

N'ebe ahụ, ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị nne na nna na-atụfu ụmụ ha nwere nkwarụ n'ihi ihere. Nke a mere o ji bido ebe obibi na Badagry.

Ọ sị n'ebe ahụ, ụmụaka ruru iri anọ na otu a tụfuru atụfu nọ n'ebe ahụ ugbua.

"Ndị mmadụ na-ele ha anya dịka ndị na-abaghị uru, mana ha bụ ụmụ Chineke nwere ikike pụrụ iche," ka o kwuru.

"Ekpere m bụ ka ha mụta otu ha ga-esi na-emere onwe ha ihe. Ka ha rụọ ọlụ, chekwaa ego n'ụlọakụ, lụọ di maọbụ nwunye, ma mụọ ụmụ".

Iji hụ na ọdịnihu ha siri ike, Akerele ghazịrị otu ndị nlekọta, ndi a na-akpọ 'Board of Trustees' na asụsụ bekee, ga-ahụ maka nkwado ha.

Ọ bụ ezie na ọ na-enye ha ọrụ na obere ụgwọ ọrụ n'ụlọọrụ ya, mana ọ na-arịọ ụlọọrụ ukwu ka ha were ha n'ọrụ. Ọ na-akpọrọ ụmụaka ndị a aga n'ụlọ akụ ka ha mụta otú e si echekwa ego na ikike ha nwere dịka ụmụ amaala.

N'agbanyeghị mbọ ezinụlọ ya na-agba, Akerele kwupụtara mmechuihu na gọọmentị anaghị enyere ha aka.

Ọ sịrị, "Akpọkuola m gọọmentị ka ha bata nyere ụmụaka a aka, mana ha anaghị aza oku m. Ka ọ dị ugbua, ọ bụ naanị m ka ha nwere iji nweta ndụ ka mma."