Etu nwoke na ndị obodo Aninri si jikọọ aka tụba nwunye ya n'ajọ ọhịa
Otu na ekwuchitere ụmụnwaanyị ọnụ ha bụ Women Aid Collective (Wacol) etiela mkpu katọọ arụ mere na Aninri dị n’Enugwu steeti ebe ha boro ebubo na ọtụtụ ụmụnwoke kwasoro otu nwaanyị iko n’ike, ebe ndị obodo na-akụrụ ha aka.
Ozi ụlọ ọrụ Wacol wepụtara n'ụbọchị 28 Julaị 2026 kọwara ka arụ ahụ na-asọ ntị oyi siri mee.
Ọ bụ nwaanyị onye Aninri ka ya na di ya na-enwe nsogbu ezinaụlọ kwa mgbe kwa mgbe.
Ndị obodo ụfọdụ gbara aka ebe na di nwaanyị ahụ gbara afọ iri atọ na anọ na-eti ya ihe oge niile ma na-emerụ ya nnukwu ahụ.
Otu ụbọchị n’ọnwa ole na ole gara aga ka nwoke ahụ tikatara nwunye ya ihe, chọọ iji mma bepụ ya isi. Nwaanyị ahụ agbara ọsọ gbagaa n'ụlọ nne na nna ya.
N’ihi na ha si n'otu obodo, nwoke ahụ ezughị ike, kwa ụbọchị ka ọ na-abịa ebe ahụ eti ya ihe gwa ya were ọsọ ọsọ laghachi be ya.
Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ na ọ chọrọ igbu ya, o ji ọsọ gbagaa na nke onye agbataobi gaa zoo.
Onye agbataobi ahụ duuru ya ga zoo ka di ya ghara ịma ebe ọ nọ. Mkpamkpa ọzọ malitere oge di nwaanyị ahụ na ndị o zoro n'ụlọ ha tịkọrọ aka ọnụ kpọbata ọtụtụ ụmụnwoke ka ha dinaa nwaanyị ahụ n’ike.
Ka ha mechara nke a, ha kpụụrụ nwaanyị ahụ kpụpụ ya n'ama obodo ebe di ya nọ n’ihu ọha mmadụ kwaa ya iko n’ike.
Ndị otu WACOL kọwara na ihe kachasị agba anyammiri bụ na ụmụnwaanyị so na-akụ aka iji kwado ihe e mere nwaanyị ahụ.
Ọ gwụchaghị ebe ahụ, ha weere mma gbukasịa nwaanyị ahụ ahụ ya niile, were osisi tie ya na onye agbataobi ọ gbagara be ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Ndị obodo Aninri buuru nwaanyị ahụ tụba n'ajọ ọhịa.
Ozi ahụ kwuru na ọtụtụ ndị obodo ji ekwentị ha see ihe onyonyoo niile merenụ.
Ọ bụzị mgbe nwaanyị ahụ ji anya ọnwụ si na ajọ ọhia ebe a tufuru ya pụta n'okporoụzọ ka ndị ji ụgbọala na-agbafe buuru ya bute ya Enugwu.
Ndị uweojii agaala obodo ahụ ihe karịrị ugboro abụọ gaa kpụrụ ndị niile aka ha dị n'arụ ahụ, nke gụnyere di ya, ụfọdụ ndị kwasoro ya iko n’ike, eze obodo ahụ nakwa ụmụnwaanyị ndị kwadoro ha.
Ụlọọrụ Wacol kwara arịrị na igwe obodo ji aka ya na-agbapụta ụfọdụ ndị ha kpụgara na nke ndị uweojii.
Ha kwuru na arụ ahụ megidere iwu VAPP Law nke Enugwu Steeti e mere n'afọ 2019, were ṅụọ iyi na ha ga-enwetarịrị ikpe nkwụmọtọ.
Ha jikwa ohere ahụ gwa gọọmenti na o nweghi onye ma ebe nwoke agbataobi ahụ e tiri ya na nwaanyị ahụ ihe nọ ugbua, ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.
Ka ọ dị ugbua, ha kwuru na nwaanyị ahụ nọ n'agbata ọnwụ na ndụ n’ụlọọgwụ.



