You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Mee 14, 2026
Akụkọ dị mkpa - Mee 14, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Esemokwu dapụtara n'etiti ndị ọkaiwu adọghachiela ikpe Justice Chidiebere azụ ụbọchị Tọzde dịka ọkaiwu ya bụ Marshal Abubakar, gwara ụlọikpe na ya agaghị anọchite anya ya ọzọ n'ikpe ahụ ma wepụ akwụkwọ arịrịọ niile o tinyeburu maka inwetara nwa amadi ahụ beelu.
- Ọkaikpe Joyce Abdulmalik nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nyere iwu ka Chidebere bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo mpu intranet anọgide n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS.
- Gọvanọ Oyo Steeti bụ Seyi Makinde ekwupụtala ebumnobi ya ịzọ ọkwa Onyeisiala n'okpuru pati Allied Peoples Movement a kporo APM n'ichafu.
- Makinde mere ka a mata nke a n' ụbọchị Tọzde n' ọgbakọ ọha nke PDP na otu APM mere n'Ibadan isiobodo Oyo Steeti.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.