Etu nwaanyị si tigbuo nwa di ya n'Emene Enugwu Steeti

Etu nwaanyị si tigbuo nwa di ya n'Emene Enugwu Steeti
Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Enugwu Steeti anwuchiela otu nwaanyị tigburu nwa di ya n'obodo Nchatancha Emene dị n'Enugwu Steeti.

Nke a dị n'ozi ngalaba mgbasaozi Gọọmenti Enugwu steeti wepụtara.

Kedụ ka o si mee?

Nwaanyị a bụ Ogechi John nke obodo Oderiko dị n’okpuruọchịchị Ikwo n’Ebonyi Steeti mana o bi na Nchatancha Emene n’Enugwu.

Ndị agbataobi kwuru na kwa mgbe kwa mgbe ka ọ na-eti nwata nwaanyị ahụ ihe ma na-emerụ ya ahụ.

Ọ bụzị n'ụbọchị Sọnde 10 Mee dị ka ọ kụrụ elekere atọ nke ehihie ka a chọpụtara na nwaanyị ahụ etikatala nwa di ya ahụ ma tigbuo ya.

Ndi Uweojii jidere nwaanyị ahụ na Mọnde 11 Mee 2026.

Kọmishọna na-ahụ maka ụmụaka n’Enugwu bụ Ngozi Enih kwuru na iwe dị Gọọmenti Enugwu n’obi maka arụ ahụ merenụ.

Enih kwuru na gọọmenti na-agbarụ ihu nye mmegbu n’ụdị ọbụla n’ebe ụmụaka nọ, ma ya fọdụzịe iji mmegbu gbuo nwatakịrị.

O kwuru na nnyocha na-aga n’ihu ugbua iji nweta ikpe mkwụmọtọ.