Puku narị naịra ise mbụ m nwetere na ndụ m bụ Sabinus nyere m ya - Nwunye Sabinus
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Nwaada na-eme ihe ikpaọchị na soshal midia bụ Winifred Chukwuemeka Nduka Osakwe e ji nwunye Sabinus maara kọrọ etu njem ya si malite.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na kamgbe ọ dị na nwata ka ọ maara na ọ bụ ihe ejije na ịkpa ọchị ka ọ ga-eme.
O kwuru na ihe niile ọ na-egosi n'ihe onyonyo bụ ihe ndị ọ mụtara n'aka nne ya; etu o si aba mba na ihe ndị ọzọ.
Winifred kwuru na o kwenyeghi na ọ bụ iwu na nwaanyị ga-edina nwoke tupu o nyere ya aka, na onye ọbụla ọ ga-eme ọyị ga-abụ maka na ọ hụrụ onye ahụ n'anya.
N'okwu ya, "Onye ọbụla mụ na ya na-emekọ ihe n’ọrụ anyị a ka ọ bụrụ maka na m hụrụ ya n’anya, a gwala m na Chineke nyere m onyinye, na ọ bụ i dinaa m, i mee m eze, mba! Ebe m ruru ugbua, onweghi onye m dinara tupu m ruo ya.
"Mgbe m na-eto amaarala m na ọ bụ ihe nkiri, nne m bụ onye nlekwasị anya m. Ihe ọbụla m na-eme ọ bụ n’aka ya ka m mụtara ya, oge ọbụla m na-ekiri ya m na-asị na ihe dịkwa ka ihe anyị na-ahụ n’onyonyo, ọkachasị ọ na-eme ihe ndị a m na-asị na nwaanyị a yiri Ebere Okaro. Ya mere m bido n’ihe ndị ahụ ọ na-eme, etu o si aba mba, etu o si akparị mmadụ na ihe ndị ọzọ, m sị na ọ bụ ebe ahụ ka m ga-ebido."
Winifred gara n'ihu kọwaa etu mmekọrịta ya na onye otu ya bụ Sabinus siri bido ma bụrụ otu n'ime njirimaara ya ugbua.
"Mgbe m bidoro, o nwere onye mụ na ya mere ihe onyonyo, Sabinus malitere iso m site n’ihe onyonyo ahụ onye ahụ tinyere na soshal midia.
"Tupu ị maara ya, otu onye so n’otu Sabinus akpọọ m sị na Sabinus chọrọ ka anyị mee ihe onyonyo. Mgbe anyị gara ebe ahụ, anya juru m, ị marala onye ị na-ahụ n’ịntanetị, ya mere emechaghị m ọfụma.
"O rughi otu izuụka, ọ kpọọ ha sị na ihe onyonyo ahụ adịghị mma, o wee sị ka anyị bịa ka e segharịa ya, anyị wee see ya, ọ bụ n’ihe onyonyo ahụ ka m nọọ kpọọ ya ‘Healthy poor man’.
"Ego ọkpụrụkpụ (puku narị naịra ise) mbụ nwetere na ndụ m dịka nwata nwaanyị bụ Sabinus nyere m ya, o mechaara gị ihe, ọ sị gị agwala mmadụ, ọ na-enyere m aka kamgbe m malitere njem a."
Kirie ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju;



