Chelsea vs Watford: E gosila Watford na ọkwụrụ anaghị akarị onye kụrụ ya

Ndị ewgu bọolụ Chelsea

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Chelsea ekweghi ka Watford menye ha ihere ma napụ ha ọkwa nke atọ ka ha zutere taa.

Ndị Chelsea chị ọkụ bịa ọkachasị n'ọkara nke abụọ oge e ji gbanye goolu atọ nyere ha mmeri.

Goolu Ruben Loftus-Cheek nyere na nkeji 48, nke David Luiz nyere na nkeji 51 na nke Gonzalo Higuain nyere na nkeji 75, zuru imechi akwụkwọ.

Mmeri a pụtara na Chelsea ga-enwe ohere ịzọ ma ha a ga-eso gbaa asọmpi Champions League nke afọ na-abịa.

Onye egwu bóólú Watford ebe ọ nọ n'ala.

Ebe foto si, AFP

Watford hiri ụra, nke nyere Chelsea ohere iji otu pọintị wụfere Tottenham, ma jiri ise na-aga Arsenal ga-ezute Brighton na mgbede taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee.

Ka ọ dị ugbua, Chelsea ga-ezute Leicester City ụbọchị ụka na-abịa, ma ha na Eintracht Frankfurt gbachaa n'asọmpi Europa n'ụbọchị Tọzde, Mee 9.