Tarị Naịra 3.3 ọ ga-eme ka ọkụ latrik na-enwu oge niile na Naịjirịa?

Aha onyonyo, Tarị Naịra 3.3 ọ ga-eme ka ọkụ latrik na-enwu oge niile na Naịjirịa?
Tarị Naịra 3.3 ọ ga-eme ka ọkụ latrik na-enwu oge niile na Naịjirịa?

Gọọmenti Naịjirịa apụtala kwuo na tarị Naịra atọ na ụma atọ ha wepụtara maka ngalaba ọkụ latrik bụ atụmatụ nnwogharị ha haziri iji gboo nsogbu ego na-echere ngalaba ahụ aka mgba kemgbe ọtụtụ oge, na ọ bụghị ịkwụ ụgwọ ọrụ karịrị ọrụ ha rụrụ.

Cheta na okwu a malitere iko achịcha oge Joy Ogaji bụ Nnukwu Onyeisi otu jikọtara ụlọọrụ ndị na-esipụta ọkụ latrik a kpọrọ Association of Generation Companies of Nigeria pụtara tie mkpu na ya amaghịkwa usoro Onyeisiala Tinubu na ndị otu ya gbakwasara ụkwụ wee chọpụta na ụgwọ e ji ha bụ tarị naịra atọ na ụma atọ.

Joy Ogaji katọrọ atụmatụ ahụ ma kwuo na e nweghị onye ọbụla kpọtụụrụ ya na ndị otu ya oge a na-akpa maka ụgwọ ahụ.

Ọ bụ gịnị butere nsogbu a?

Cheta na kemgbe ọnwa ole na ole ka ọkụ latrik malitere inwu pịnyụ pịnyụ, bụ nke Minista na-ahụ maka ikike ọkụ bụ Adebayo Adelabu gwara anyị na ọ bụ n'ihi ụkọ mmanụ gaasị nakwa agha dị n'Ịran.

Ka ụbọchị ole na ole gara, ihe ọzọ anyị nụrụ bụ na Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na ya akwadola atụmatụ e ji akwụchapụ ụgwọ niile e jikọrọ ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik, site n'ihe omume a kpọrọ Presidential Power Sector Financial Reforms Programme.

Atụmatụ a, dịka ozi sitere n'obi ọchịchị Naịjirịa siri kwuo, bụ iji kwụchapụ akatamkpo ụgwọ e jikọrọ ngalaba ọkụ latrik site n'ọnwa Febụwarị, afọ 2015 ruo n'ọnwa Maachị, afọ 2025, ma hụ na a kwalitere ikike ọkụ latrik gburugburu Naịjirịa.

Ozi ahụ, nke ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara, sịrị na ha mere nnyocha ma nwee nkwekọrịta ịkwụ tarị Naịra atọ na ụma atọ iji weta okwu ahụ na njedebe, bụ nke ọ sịrị na ụlọọrụ iri na ise na-esipụta ọkụ latrik binyere aka na ya.

O kwuru, na Gọọmenti Naịjirịa amawapụtalarị narị ijeri Naịra ise na otu iji kwado ụgwọ ndị a dịka ha kesarala narị ijeri Naịra abụọ na iri abụọ na atọ n'ime ego ahụ.

Ugbua, ajụjụ anyị bụ, i chere na tarị Naịra atọ na ụma atọ a Gọọmenti Etiti kwuru na ha wepụtara maka ngalaba ọkụ latrik ga-eme ka ọkụ na-enwu oge niile gburugburu Naịjirịa?