You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E gburu otu n'ime ndị nkuzi a tọrọ n'ụlọakwụkwọ - Gọvanọ Oyo steeti
Aka na-achị Oyo steeti ekwuola na ndị na-eyi ọha egwu egbola otu n'ime ndị nkuzi asaa a tọọrọ na steeti ahụ.
Seyi Makinde kwuru na a tọọrọ ndị nkuzi asaa n'ụlọakwụkwọ atọ dị na okpuruọchịchị Oriire n'ụbọchị Fraịde gara aga.
O kwuru na e gburu onye nkuzi nke e kwuru na ọ bụ mgbakọ na mwepụ ka ọ na-akụzi.
Ka ọ dị ugbu a, ndị uweojii na ndị ọchịchị steeti kwuru na ha ka na-agbalị ịchọpụta kpọmkwem ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ na-efu efu.
Mana akụkọ ụlọmgbasa ozi mpaghara na-ekwu na a tọọrọ opekatampe, ụmụaka ruru iri anọ na ise.
Gọvanọ kwuru na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa na-azaghachi ndị ahụ na-eyi ọha egwu mgbe ha na-eme mwakpo ahụ merụkwara ahụ.
"Ndịagha, ndị dinta na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ merụrụ ahụ na-agbake nke ọma," ka o kwuru.
Makinde kwuru na steeti ya guzobere ihe ọ kpọrọ "otu nzaghachi mpụ ime ihe ike" na mmekọrịta ya na ndị uweojii.
Cheta na ọ bụ ụbọchị Sọnde 17 Mee 2026, ka onyonyoo na-efegharị n'ịntanetị gosiri ụmụnwaanyị na-ekwu na ha so n'ime ndị a tọọrọ ma na-arịọ maka enyemaka.
Mana ndị uweojii kwuru na ha na-enyocha eziokwu dị n'ihe nkiri ahụ ma dọọ ọhanaeze aka na ntị ka ha ghara ikesa ozi a na-emeghị enyocha nke nwere ike ime ka ụjọ jide ndị mmadụ.
Ọzọ, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.
Ka ọ dị ugbu a, e mechiri ụlọakwụkwọ dị na mpaghara ndị ihe ọjọọ metụtara na mbụ, mana gọọmenti steeti ahụ mechara nye iwu ka ha mepee ụlọakwụkọ ndị ahụ n'ụbọchị Mọnde mgbe e tinyere ndị ọrụ nchekwa ọzọ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ndị nchekwa amalitela ịchọ ụmụaka 50 ndị ojiegbe tọọrọ na Mussa, Borno steeti
N'aka nke ọzọ, ndị ọchịchị Borno steeti ezigala ndị nche obodo na ndị nchekwa iji chọta ụmụaka ruru ihe dịka iri ise nke ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọakwụkwọ dị na Mussa.
Onyeisioche nke okpuruọchịchị Askira Uba nke ya na ogbo ya si Chibok gara obodo Mussa n'ụbọchị Sọnde 17 Mee iji tie ndị nne na nna nke ụmụaka a tọọrọ aka n'obi ma kwe nkwa ime ihe niile ha nwereike ime iji hụ na a tọhapụrụ ha ma kpọghachite ha n'ụlọ.
Ọ gwara ndị nne na nna na otu ndị nche nd ndịagha ga-arụkọ ọrụ iji chọpụta ebe ndị tọọrọ ahụ nọ.
Ka ọ dị ugbu a, otu nne na nna agwara BBC na ụmụaka abụọ n'ime ụmụakwụkwọ a tọọrọ agbapụla n'aka ndị jidere ha ma laghachi n'ezinaụlọ ha.
Cheta na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu jihadist wakporo ụlọakwụkwọ atọ dị na Mussa n'ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026, na-agba egbe iji mee ka ụjọ jide ha tupu ha chịkọta ụfọdụ ụmụakwụkwọ wee buru ha n'ụgbọ ọgbatumtum.
E kwukwara na ọtụtụ n'ime ụmụaka ahụ bụ obere ụmụaka dị n'agbata afọ abụọ na ise, si Mussa Central Primary School nke nwere ụlọakwụkwọ ọta akara na ngalaba praịmarị.
Ndị hụrụ ihe merenụ n'ụtụtụ Fraịde na Mussa, Borno steeti, kwuru na ndị a na-enyo enyo ji ụmụaka ahụ kpochie onwe ha mgbe ha na-agba ọsọ n'ụgbọ ọgbatumtum nke na-egbochi ndị nchekwa ịgba ha egbe.
Ka ọ dị ugbu a, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.
Ntọrọ ndị a mere n'ụlọakwụkwọ sekọndrị nke gọọmenti nwe bụ Government Day Secondary School, ụlọakwụkwọ praịmarị Mussa Central Primary School, na ụlọakwụkwọ sekọndrị nke State Universal Basis Education Board (SUBEB).
Kedụ etu ntọrị Oyo na Borno steeti si yie?
*Ha abụọ mere n'otu ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026.
* Ndị ojiegbe ahụ wakpọrọ ụlọakwụkwọ ruru atọ n'otu okpuruọchịchị.
* Ọ bụ ụmụakwụkwọ iri ise ka a tọrọ na Borno steeti ebe ihe ruru ụmụakwụkwọ iri anọ na ise ka a tọrọ n'Oyo steeti.