Etu ndị Udogachị siri gbaa ndị uweojii abụọ egbe n'Anambara Steeti

Etu ndị Udogachị siri gbaa ndị uweojii abụọ egbe n'Anambara Steeti
Mgbe e biputara ya

Maazị Ibezi kpọrọ ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị n’ogige Abatete Anambara Steeti n'ụbọchị Sọnde 26 Eprel 2026 , mana ọgbaaghara malitere oge ndị ọrụ nchekwa Udogachi wakporo ebe a na-eme nzụkọ ahụ, wee sị na ha agaghị aga n’ihu.

Mazị Ibezi boro ebubo na ọ bụ Onyeisi okpuru ọchịchị Idemmili North bụ Maazị Stanley Nkwọka zitere ndị ọrụ nchekwa ahụ ka ha mee ọgbaaghara.

Dịka ọgbaaghara ahụ na-aga n’ihu, o kwuru na onyeisi ndị ahụ zitere bụ onye ''Civil Defence'' aha ya bụ Chima Udu na ndị otu ya gbawara egbe aghara aghara.

"Otu n'ime ndị ọrụ nche ahụ chere m egbe n'ihu, wee gbaa ya, ọ bụ m ka ha chọrọ igba. Mana mgbọ ahụ tụrụ ndị uweojii abụọ nọ ọrụ ebe ahụ."

Ọ kwara arịrị na ndị nche ahụ na-ebutere Gọọmenti Anambara ajọ aha n'agha Gọọmenti Chukwuma Soludo na-ebuso enweghị nchekwa na steeti ahụ.

Onyeisioche Idemmili North bụ Maazị Nkwọka gọrọ na ya ezighị onye ọbụla gaa gbaa mmadụ egbe.

Kama ọ tara Maazị Ibezi ụta na o kwesịrị ịgwa ya maka ọgbakọ ahụ ka ya nye ikike tupu ya agaa n'ihu mee ọgbakọ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambara Steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ọ bụ n'ezie na a gbara ndị uweojii abụọ egbe mana ha anwụghị.

Ka ọ dị ugbua, Maazị Ifeanyi Ibezi kwuru na ya ga-eso ụzọ iwu obodo wee chọpụta ndị niile ziri ha, ndị gbara egbe na ndị nkwado ka a taa ha ahụhụ dịka iwu si kwuo, wee nweta ikpe nkwụmọtọ.