Justice Chidiebere: Esemokwu dapụtara n'etiti ndị ọkaiwu adọghachiela ikpe Nwaamadi a azụ

Justice Chidiebere a ma ama dịka 'Justice Crack'

Ebe foto si, Screengrab/Justice Chidiebere/Facebook

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọkaikpe Joyce Abdulmalik nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela iwu na Justice Chidebere a ma ama na sosha media dịka 'Justice Crack' ka ga-anọgide n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS, dịka ọkaiwu ya wezugara onwe ya n'ikpe ahụ ụbọchị Tozde.

Ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'ịchafụ kpụpụrụ Justice ụlọikpe maka ebubo mpụ intanet (cybercrime) na ịkpa nkata ibute ọgbaghara dịka ọ katọrọ ụdị nri ndịagha na-enye ndị ogbo ha nọ n'ihu agha megide ndị Boko Haram na ndị oyinduegwu ndị ọzọ.

Dịka ikpe ahụ malitere, ọkaiwu Justice Crack, bụ Marshal Abubakar, gwara ụlọikpe na ya agaghị anọchite anya ya ọzọ n'ikpe ahụ nke pụtara na akwụkwọ arịrịọ niile o tinyere maka inwetara nwa amadi ahụ beelu alaala n'iyi.

Ọkaiwu Marshall Abubakar, n'oge ndị nta akụkọ gbagara ya n'ajụjụ ọnụ, kọwara na ihe kpatara o jiri hapụ ikpe ahụ bụ na onye a na-ebo ebubo bụ Justice Crack egosighị ya dị ka onye na-anọchite anya ya mgbe ọkaikpe jụrụ ya; kama, ọ họọrọ Ọkaiwu Femi Balogun.

Ụlọikpe enyela iwu ka a tụnye Justice Chidiebere na mkpọrọ DSS

Aha onyonyo, Ihe mere ụlọikpe ji hara inye Justice Crack ntọhapụ beelụ taa

Ụlọikpe enyela iwu ka a tụnye Justice Chidiebere n'ụlọmkpọrọ DSS.

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela iwu ka a tụnye Justice Chidebere a ma ama dịka 'Justice Crack' na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ Department for State Secret Service(DSS) maka ebubo metụtara mpụ intanet (cybercrime) na ịkpa nkata ibute ọgbaghara (breach of public peace.)

Mana Chidiebere gọrọ n'aka ya dị ọcha dịka a gụputara ebubo ndị ahụ n'ụlọikpe.

Ọkaiwu wetara ikpe ahu n'ụlọikpe bụ Mark Oruba rịọrọ ọkaikep ka e jichie nwa amadi ahụ ruo oge a ga-amalite ikpe ya n'uju.

Mana ọkaiwu nọchitere Chidiebere bụ Marshall Abubakar rịọrọ ụlọikpe ka a tọhapụ ya, nye ya ohere isi ụlọ ya na-abịa ikpe ahụ.

Jọstịs Joyce Abdulmalik nọ n'isi ya bụ ikpe jụrụ ajụ ma sị ya dee arịrọ ya n'akwụkwọ kama iji ọnụ arịọ ya.

Ọ gara n'ihu nye iwu ka a tụnye ya na mkpọrọ DSS ganye abalị Mee 25 bụ ụbọchị a ga-ekpe ikpe ahụ ọzọ.

Na nsonso a, Chidibere , onye bi na Lugbe dị n'Abuja, mere ihe ononyo ebe ọ katọrọ ndị agha maka mgbagbu a sị ndị otu ha gbagburu o ut nwata nwoke ji otu afọ efe ala na ya O mekwara ihe ọzọ ebe ọ katọọ ndịagha Naijiria aka anaghị enye ndịagha nọ n'ihu agha megide ndị agha nnụpụisi ezigbo nri.

: Ndị ntorobia kwụchiri ụzọ jụ inye ohere ka DSS kpụrụ Justice Chidiebere a pụọ n'ụlọikpe

Justice Chidiebere

Ebe foto si, BBC/Justice Chidiebere

Ndị ntorobia na ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye gbochiri ndị uweojii nzuzo a na-akpọ "Department of State Services, (DSS)" ịkpụrụ nwọke aha ya bụ Justice Chidiebere pụọ n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja.

Chidiebere bụ onye a maama na sohal mịdịa dịka 'Justice Crack'.

Ndịagha Naijiria jidere ya maka ebubo dị icheiche banyere onyoonyo o mere ma kasaa na soshal mịdịa tupu ha aranye ya n'aka ndị uweojii nzuzo.

Ha bokwara Chidiebere ebubo imebi iwu mgbasaozi ndịagha na-akatọ ụdị nri ndịagha nọ n'ihu ọgụ na-eri.

Mana ndị ntorobia na-eti mkpu sị, "Hapụnụ Justice Crack". "Anyị agaghị ekwe".

Ha gbara Justice gburugburu jụ inye DSS ohere ịkpụrụ ya pụọ dịka ha kpụtachara ya ụlọikpe.

Aha onyonyo, Oge ịkpeazụ mụ na di m hụrụ - nwunye Justice Crack Chidiebere.

A malitere ịchọ Chidiebere achọ n'abalị 28 nke ọnwa Eprelu dịka ọ gwara nwunye ya ka ọ gaa nzukọ.

Nnyọcha ji igwe intanet mee rụtụrụaka n'ebe ikpeazụ ahụ ya bụ n'ogige ndịagha.

E mechara Ndịagha Naịjirịa ekwuo n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Satode na ọ bụ ha ji ya.