Nigeria Police recruitment: Ị chọrọ ịbụ onye uweojii? Lekwa usoro ndenye aha ọhụrụ

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Naịjirịa ekwuputala usoro ndị mmadụ gafere agba nke mbụ na njem iwe ọrụ ha nọ n'ime ya ugbua.

N'agba nke a nọ ugbua, ọ bụ nke ndị mmadu ga na-etinye asambodo ha n'akara ịntanetị ndị uweojii ji ahazi iwe ọrụ a.

Dịka ngalaba na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii na ndị ọha siri dee na soshal midia n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jụlaị, ndị na-achọ ọrụ ga-abanye n'ọba ịntanetị www.policerecruitment.gov.ng ma mee ihe ndị a:

  • Tinye akara njirimara a kpọrọ National Identity Number (NIN) n'ebe o kwesiri
  • Zaa azịza e kwesiri ịza
  • Tinye foto asambodo dịka: Asambodo ngụcha akwụkwọ, Asambodo ngosi oge a mụrụ mmadụ nakwa asambodo gosiri ebe onye si, nke Bekee kpọrọ "Certificate of Origin".

Ihe ọzọ onye ahụ na-achọ ọrụ ga-eme iji hụ na a nabatara nke ya bụ:

  • Ịpị ebe gosiri na i kwenyere n'ihe a na-eme
  • Ibipute akwụkwọ ga-egosi na a nabatara ihe i mere
  • Ibipute akwụkwọ onye ga-aṅụrụ gị iyi nkwado ga-ebinye aka.

Ọ bụ na Fraịde ka ndị uweojii Naijirịa kwuru na ha ga-abanye agba ọzọ n'atụmatụ iwe ndị mmadụ n'ọrụ nke afọ 2020.

Ha sị na onye nwere nsogbu kpọọ ekwentị ha bụ 08100004507, maọbụ zie ozi n'email ha bụ e-training@recruitment.gov.ng maọbụ support@policerecruitment.gov.ng.