Onyeomeiwu Naịjirịa agwala BBC na ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ na Borno Steeti

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Oke mmiri ozuzo na idemmiri egbuola ihe karịrị mmadụ 23 na Kenya

    Ọtụtụ ụgbọala ndị mmadụ idemmiri mebiri ka ha tọgbọrọ n'okporoụzọ

    Ebe foto si, Reuters

    Ihe karịrị mmadụ iri abụọ na atọ anwụọla na Nairobi bụ isiobodo Kenya dịka oke mmiri ozuzo na idemmiri mere n’abalị Fraịde bọtara Satọde 7 Maachị 2026.

    Ndị uweojii kwuru na a zọpụtala ihe ruru mmadụ iri atọ mana mmiri riri ọtụtụ ndị ọzọ dịka idemmiri buuru ha – ebe ọkụ latrik dọgburu ụfọdụ.

    E zigaala ndịagha mba Kenya n’ebe ahụ inye aka zọpụta ndị tọọrọ n’ime ụgbọala ha, ebe ndị uweojii kọwaara na ọtụtụ ngwo ngwo lara n’iyi dịka e mechie okporoụzọ e si aga ebe ahụ.

    A kagbuola ọtụtụ njem ụgbọelu na-aga na Nairobi ma ziga ụfọdụ n’obodo ọzọ dịka Mombasa.

    Onye ji ụgbọepepe na osisi n'aka na-akwọ onwe ya n'elu idemmiri

    Ebe foto si, EPA

    Ọtụtụ okporoụzọ dị n’isiobodo ahụ, gụnyere okporoụzọ Mombasa, Uhuru, Kirinyaga na ndị ọzọ ka mmiri tojuchara.

    Ndị ọrụ na mba Kenye agwala ndị mmadụ ka ha ghara ịge n’okporoụzọ ebe mmiri tojuru dịka ndị ọrụ gbata gbata na-enyere ndị njem aka n’ụzọ.

    Ndị ọrụ mgbanwe ihueluigwe n amba Kenya dọrọ aka na ntị na oke mmiri ozuzo nwere ibute idemmiri n’obodo ndị mepere emepe.

    A na-atụ anya na ogogo mmiri nwereike ịgbago elu ruo ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị a.

    N’afọ gara aga, ọtụtụ ụmụafọ mba Kenya nwụrụ site n’oke mmiri ozuzo, idemmiri na ala mbuzi mere na mba nakwa na Tanzania.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  2. Ndịagha Naịjirịa egbuola ndị ekperima 45 na Katsina Steeti

    Ndị ojiegbe bucha egbe nọrọ n'elu ọgbatumtum

    Ebe foto si, Other

    Ndị ọrụ gọọmenti na mpaghara ugwu Naịjirịa ekwuola na ndịagha Naịjirịa gburu ndị ojiegbe mmadụ iri anọ na ise na steeti Katsina.

    Nke a mere na mgbede ụbọchị Fraịde dịka ndị ọrụ gọọmenti steeti ahụ si kwuo.

    Akụkọ kwuburu na ndị ojiegbe sin a steeti Zamfara nọ ha n’akụkụ wakporo obodo Alhazawa dị n’okpuruọchịchị Danmusa na Tọzde izu ehi.

    Mana, ndị obodo gbara isiakwara ma gbochie ndị a, gbuo mmadụ anọ n’ime ndị ojiegbe ahụ.

    Ka otu ụbọchị gachara, ndị ojiegbe gbakọtara ọzọ buru n’obi imegwara ihe a ndị obodo mere ha, mana ha zutere ndịagha nke butere ịkwarịkọta mgbọ n’etiti ha.

    Akụkọ kwuru na e gburu ndịagha mmadụ atọ nwụrụ na mwakpo ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  3. Onyeomeiwu Naịjirịa agwala BBC na ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ na Borno Steeti

    Sinetọ Ali Ndume gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ nweere ọnọdụ n’obodo ahụ ruo abalị abụọ tupu ndịagha wee chụpụ ha.

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu onyeomeiwu Naịjirịa agwala BBC na ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ n’obodo dị na Borno steeti n’abalị Wenezde 5 Maachị, 2026 mana o kwughị mmadụ ole e gburu.

    Sinetọ Ali Ndume kwuru na ozi ya nwetere n’aka onyeisioche okpuru ọchịchị obodo ahụ kwuru na ndị ojiegbe ahụ gburu ọtụ™ụ ndị obodo Ngoshe.

    Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo obodo Ngoshe bụ obodo ndị alakụba n’abalị Wenezde dịka ha na-akwado ịkwụsị ekpere ebumọnụ Ramadan ụbọchị ahụ.

    BBC akpọtụrụla isiụlọọrụ ndịagha Naịjirịa iji nweta ọnụ mmiri okwu ha banyere mwakpo ahụ.

    Ụlọmgbasaozi obodo kwuru na ndị ojiegbe wakporo ogige ndịagha ebe ndị gbara ọsọ ndụ nọ, gbuo ọtụtụ ndịagha, ndị nkịtị, ndịisi ụka Alakụba, ndị okenye ma tọrọ ụmụnwaanyị na ụmụaka ruru otu narị.

    Sinetọ Ndume gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ nweere ọnọdụ n’obodo ahụ ruo abalị abụọ tupu ndịagha wee chụpụ ha.

    O kwuru na ọ dị ka ndị ojiegbe ahụ e zuuru ngwaagha ndịagha ahụ ha wakporo ogige ha.

  4. Ụnụ asaala chi ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 7 Maachị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  5. Ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ojiegbe awakpoola Rotimi Amaechi na Riva Steeti

    Ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ojiegbe awakpoola Rotimi Ameachi na Riva Steeti

    Ebe foto si, Chibuike Rotimi Ameachi/X

    Ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ojiegbe wakporo ahịrị ụgbọala onye bụbu gọvanọ Riva Steeti bụ Chibuike Rotimi Amaechi, n’ime obere oge ọ gara idebanye aha ya dịka onye otu African Democratic Congress (ADC).

    Ọnọdụ a dapụtara n’ụbọchị Fraịde 6 Maachị 2026 n’okpuru ọchịchị ime obodo Ikwerre dị na Riva Steeti.

    Ndị hụrụ mgbe o mere kwuru na ha nụrụ ụda egbe aghara aghara n’akụkụ obodo Ubima dị iche iche, dịka ahịrị ụgbọala onye ahụ bụbu Minista na-agaru n’ogige ndebanyeaha.

    Ha kwuru na ọnọdụ ahụ butere obi mmapụ n’etiti ndị bi n’obodo ahụ nakwa ndị nkwado gbakọrọ maka emume ahụ.

    Akụkọ kwuru na ndị nchekwa zọpụrụ njem ozugbo iji weghachi udo ma gbochie ọnọdụ ahụ ịmụbawanye.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    N’agbanyeghị ọdachi ahụ, Amaechi gara n’ihu debanye aha ya dịka onye otu ADC n’obodo a mụrụ ya tupu ọ gwa ndị nkwado ya na ndị bi ebe ahụ okwu.

    Oge ọ na-ekwu okwu, Amaechi katọrọ mwakpo ahụ, ma kelee ndị ọrụ nchekwa dị iche iche maka ịgbata ọsọ enyemaka n’oge, tinyekwara ụzọ dabara adaba ha jiri zute ọnọdụ ahụ.

    O kwuru na ndị uweojii, ndị ọrụ DSS na ndị ọrụ Civil Defence gbatara ọsọ n’oge ma nye aka mee ka ebe niile dere duu.

    Ka o sina dị, ụlọọrụ ndị uweojii na Riva Steeti enwebeghị ihe ọbụla ha kwuru gbasara ọnọdụ a.

  6. Ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa akpọọla Mele Kyari banyere ego NNPCL na-efu efu.

    Ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa akpọọla Mele Kyari banyere ego NNPCL na-efu efu.

    Ebe foto si, Getty Images

    Kọmiiti ụlọomeiwu Naịjirịa na-ahụ maka ego dịịrị ọha akpọọla onye bụbu onyeisioche ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation, Mele Kyari, oku ka ọ bịa gbaa akaebe banyere ebubo ego dị tarịị narị abụọ na ijeri iri (N210tn) ụlọọrụ ahụ a na-achọ achọ oge ọ bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ.

    A kpọrọ Kyari nakwa onye bụbu onyeisi na-ahụ maka ego ụlọọrụ ahụ bụ Umar Ajia Isa nakwa onye bụbu onyeisi na-ahụ makai ji ego tụọ mgbere bụ Bala Wunti.

    Onyeisioche kọmiiti ahụ bụ Sinetọ Aliyu Wadada nyere iwu ka a kpọọ Kyari na ndị ọzọ ahụ dịka kọmiiti ahụ nnyochara ego ụlọọrụ NNPCL mefuru oge ha jị ọkwa na ya.

    Sinetọ Wadada mere ka o doo any ana ha nwereike inye iwu ka a nwụchie ha ma ọ bụrụ na ha azaghị oku ahụ a kpọrọ ha.

    Kọmiiti ahụ gwara Kyari na ndị ọzọ ahụ ka ha na onyeisi ụlọọrụ NNPCL ugbua bụ Bayo Ojulari nakwa ndị ọzọ niile rụrụ nnyocha ego mmefu bekee kpọrọ ‘auditors’ rụrụ ọrụ oge Kyari bụ onyeisi ụlọọrụ NNPCL.

  7. Mba Amerịka na Venezuela amalitela inwe mmekọ ọzọ dịka Amerịka nwụchiri Maduro

    Mba Amerịka na Venezuela amalitela inwe mmekọ ọzọ dịka Amerịka nwụchiri Maduro

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka na mba Venezuela enwela nkwekọrịta ịmalite inwe mmekọ ọzọ.

    Nke a na-abịa dịka mba abụọ ahụ kwuru na ha ga-agba mbọ kwalite mmekọ dị n’etiti ha ma wulite ọnọdụ akụnaụba ha nakwa mmekọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    N’agbanyeghị na mmekọ na-aga n’ihu n’etiti mba abụọ kemgbe ndịagha mba Amerịka nwụchiri onyeisiala Nicolás Maduro na-achị Venezuela, nkwuputa a bụ nke pụtara na ihe a na-ekwu abụrụla eziokwu.

    Cheta na Onyeisiala Donadl Trump nyere iwu ka a nwụchie Maduro na nwunye ma kpọta ha n’ụlọikpe dị na Manhattan maka ebubo ịtụ mgbere ngwaagha, ọgwụike nakwa ebubo ndị ọzọ nke Maduro gọnarịrị.

    Ogige ụlọ nnọchiteanya mba Amerịka dị na Caracas nke mechiri kemgbe afọ 2019 emepeela ọzọ ebe isiobodo Amerịka bụ Washington ahọpụtala onye nnọchiteanya na Venezuela.

    Gọọmenti Venezuela kwuru na ha kwụrụ chịm ịkwalite mmekọ ahụ nke ga-eweta ezi ọganihu.

    Ha kwuru na nke a ga-akwalite ọnọdụ akụnaụba ndị mba Venezuela mana ozi ha ekwughị maka inyefe ọchịchị maọbụ ime ntuliaka n’agbanyeghị na ozi mba Amerịka wepụtara tụrụ aka na ya

  8. Gọọmenti Ebonyi steeti enyela iwu ka a kụkpọcha ụlọ arụsị dị icheiche n'Okpolojo na Amasiri

    Govanọ Francis Nwifuru na ndị ọzọ.

    Ebe foto si, Ebonyi state govt house

    Gọọmenti Ebonyi steeti enyela iwu ka a kpụkpọchaa ụlọ arụsị dị icheiche n’obodo a na-akpọ Amasiri nakwa Okpolojo maka ọgbaghara dapụtara n’etiti ha.

    Gọọmenti steeti ahụ nyere iwu nke a dịka usoro ha chọọ iji chọta udo n’etiti obodo abụọ ahụ na-enwe nnukwu ọgbaaghara nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.

    Ha jikwa ohere ahụ guzobe komittii mmadụ iri na itoolu ga-enyereaka hazie oke ala nke na-esere ha okwu.

    Govanọ Francis Nwifuru mere ka a mata nke a dịka ya na ndị ọrụ nchekwa nwechara ọgbakọ n’Abakaliki.

    Nwifuru na iwu onye apụla ilo e tinyere na mpaghara steeti ahụ ka ga-adị.

    Ndị nọ na kọmittii ga-ahazị oke ala Amasiri na Okpolojo gunyere 'Surveyor General' nke Ebonyi Steeti, Kọmịshịọna na-ahụ maka ala, Kọmịshịọna na-ahụ maka agụmụakwụkwọ nakwa onyeisi ndị eze ọdịnaala na steeti ahụ.

    Ebe odeakwụkwọ ha ga-abụ maazị Sunday Oyibe.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  9. Ọtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 6 Maachị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  10. Ụlọikpe atọhapụla Abba Kyari maka ebubo nkwupụta akụ na ụba

    Abba Kyari bụ onye uweojii Naịjirịa a ma ama maka ike ọ kpara ibuso ndị ekperima agha

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Abba Kyari bụ onye uweojii Naịjirịa a ma ama maka ike ọ kpara ibuso ndị ekperima agha

    Ọkaipke James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja a tọhapụla Abba Kyari maka ụfọdụ ebubo ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ ike na Naịjirịa boro ya nke gụnyere ebubo nkwupụta akụ na ụba.

    Cheta na ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) na-ebu agha megide ọgwụ ike na Naịjirịa boro Abba Kyari onye bụ osote kọmishọna ndị ụweojii tupu akwụsitụ ya ọrụ, ebubo iri abụọ na atọ nke gbakwasịrị ukwu na o kwupụtaghị ihe ndị onwunwe ya dị iche iche.

    Mana Ọkaikpe Omotosho kwuru na ụlọọrụ NDLEA ewetaghị ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ iji gosi na ebubo ndị ha boro ya bụ eziokwu karịsịa nke ha kwuru na o kwupụtaghị ihe onwunwe ya.

    Ọkaikpe Omotosho kwuru na ụlọọrụ NDLEA kpụpụrụ Kyari n’ụlọikpe maka ụlọ ndị nọ na ‘Fountain Estate, Karsana eweputaghị ihe akaebe gosiri ụlọ ndị ahụ bụ nke Ramatu Kyari bụ nke Abba Kyari.

    N’aka nke ọzọ, ha sị na ọ bụ ya nwe ụlọ dị na okporoụzọ ‘Linda Choko’ dị n’Asokoro, Abuja, nakwa ụlọ dị na Maiduguri nke steeti Borno mana Abba Kyari sị na ụlọ ndị nọ na Borno steeti bụ nke nna ya nwụrụ anwụ hapụrụ ya na ụmụnne ya.

    Ọkaikpe Omotosho kọwara na mmadụ nwereike inwe ụlọ site na otu n’ime ụzọ ndịa nke gụnyere akụkọ ọdịnaala, akwụkwọ ikike ụlọ, ihe onwunwe maọbụ ihe onwunwe site na njikọ.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  11. Ndịagha Naịjirịa sị ha ekposaala ogige IPOB/ESN ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ

    Ndịagha Naịjirịa ji ọkọlọtọ e dere isiụlọọrụ ndịagha Biafra Liberation Army

    Ebe foto si, Nigerian Army/X

    Ndịagha Naịjirịa sị ha ekposaala ogige ndị IPOB/ESN ọzọ dịka ha na-awakpo ọtụtụ ogige ha dị n’Anambra na Imo Steeti.

    Na ndịagha Naịjirịa n’ọrụ ha kpọrọ ‘Operation Sanity’ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ sị ha akụsasịala ogige ọzọ bụ nke ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) na ndị ojiegbe ha bụ Eastern Security Network (ESN), dị n’Orsumoghu nakwa Ihiala nke Imo na Anambra Steeti.

    Ha mere mwakpo n’ụbọchị atọ na anọ nke ọnwa Maachị 2026 dịka ha kposara ọtụtụ ogige ndị a dị iche iche.

    Ọtụtụ egbe ntụ ndịagha kpachiri n'ogige ndị ESN

    Ebe foto si, Nigerian Army/X

    Ndịagha kwuru na ụfọdụ ihe ndị ha kpachiri na mwakpo ahụ gụnyere egbe ‘pump action’, egbe akpụrụakpụ, na ọtụtụ egbe ndị ọzọ na mgbọ ha, mma oge nakwa ngwa egwu, akwụkwọ ego Biafra, akụrụngwa ogbunigwe, ọkọlọtọ Biafra, ọtụtụ batịrị ụgbọala. Igwe e ji egwu ala na nke e ji agbakọta igwe ọkụ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Mana ndịagha ekwughi ma o nwere onye n’ime ndị otu a ha jidere maọbụ gbuo na mwakpo ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  12. Gọọmentị DR Kongo ekwuola na mmadụ 200 anwụọla na mbụze mere ebe ngwupụta ihe ndị nnupụisi na-achịkwa

    E kwuru na ebe a na-egwupụta ihe na Rubaya, nke dị n'okpuru njikwa M23 ugbu a, adịghị mma nke ọma.

    Ebe foto si, Hassan Lali / BBC

    Nkọwa foto, E kwuru na ebe a na-egwupụta ihe na Rubaya, nke dị n'okpuru njikwa M23 ugbu a, adịghị mma nke ọma.

    Gọọmentị ekwuola na ihe karịrị mmadụ narị abụọ gụnyere ụmụaka iri asaa anwụọla mgbe mbụze ala mere n’ebe a na-egwupụta ihe n'ọwụwa anyanwụ nke Democratic Republic of Kongo.

    Mbụze ahụ mere na Rubaya, ebe mba ahụ kachasị enweta ihe si na Chi ‘coltan’ - ihe dị mkpa n'ahịa eletrọniki - n'ebe ọwụwa anyanwụ nke ndị nnupụisi na-achịkwa na Tuzde mgbe mmiri ozuzo siri ike gasịrị.

    N'okwu ha, Mịnịstrị na-ahụ maka ebe a na-egwupụta ihe n'ala kwuru na ọ bụ ndị nnupụisi M23 kpatara ọdachi ahụ, ha bokwara ha ebubo na ha na-ekwe ka a na-gwupụta ihe n'ụzọ iwu na-akwadoghị n'enweghị nchekwa kwesịrị ekwesị.

    Ndịagha nnupụisi M23 ekwubeghị okwu mana otu onye na Rubaya gwara BBC na mbibi ahụ sitere na mwakpo sitere n'aka ndịagha gọọmentị, naanị mmadụ isii nwụrụ. Gọọmentị azabeghị okwu ahụ.

    A na-eche na ebe a na-egwupụta ihe dị na Rubaya nwere ihe dịka pasentị iri na ise nke mmanụ coltan zuru ụwa ọnụ na ọkara nke ego niile DR Kongo nwere.

    Kemgbe afọ 2024, M23 anọwo na-achịkwa Rubaya, nke dị ihe dịka kilomita 70 (maịlụ 45) n'ọdịda anyanwụ Goma, isi obodo North Kivu.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

  13. Tunji Disu ekwuola na ọ gaghị anabata onye uweojii na-akpa agwa ọjọọ ọbụla

    Foto Tunji Disu oge ọ na-agwa ndị uweojii okwu n'ọgbakọ ahụ ha nwere n'Abuja

    Ebe foto si, Nigeria Police/X

    Onye ndị uweojii Naịjirịa bụ Tunji Disu adọọla ndị ọrụ ya niile aka na ma kwuo na ya agaghị anabata onye uweojii ọbụla na-akpa ajọ agwa n’ụdị ọbụla.

    Tunji Disu onye kwuru nke a n’ọgbakọ ya na ndịisi uweojii nwere n’isiụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa dị n’Abuja, mere ka o doo anya na ndị uweojii ịkpa ajọ agwa bụ otu ihe na-emebi aha ndị uweojii ma mee ka ọhanaeze ghara inwe ntụkwasịobi n’ebe ndị uweojii nọ.

    Ọ kpọrọ oku ka ndị ọrụ ya niile rube isi nye iwu obodo Naịjirịa ma kwanyere onye ọbụla ugwu ruuru ha dịka ụmụafọ Naịjirịa.

    O kwuru na onye uweojii ọbụla a chọpụtara na ọ na-akpa ajọ agwa ọbụla, ga-eweta ntaramahụhụ zuruoku dịka iwu si kwuo.

  14. Ọtụtụ ọma ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Anyị ji obi aṅụrị anabata ụnụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 5 Maachị 2025 ma bụrụ ahịa Eke.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!

  15. Onyeisiala Tinubu akwụsitụla iwu ejighị ego akwụ ụgwọ n'ọdọụgbọelu Naịjirịa

    Mbara ezi ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mbara ezi ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu enyeela iwu ka akwụistụ atụmatụ iji akwụkwọ ego akwụ ụgwọ na ọdọụgbọelu Naịjirịa

    Tinubu kwuru nkea mgbe o mechara nzukọ ‘Federal Executibe Council’ n’ụbọchị Wenezde n’ihi na atụmatụ ahụ butere nsogbu nakwa ihe isike nyere ndị ji ụgbọala abata na ọdọụgbọelu ime njem.

    Minista na-ahụ maka ọrụ Ụgbọelu na mmepe Ụgbọelu bụ Festus Keyamo kwupụtara nkea ma kọwa na Onyeisiala Tinubu site na obi obere, si ka akagbuo atụmatụ ejighi ego akwụ ugwọ ma laghachite etu ha si eme ya na mbu maka ọtụtụ ndị mmadụ na-anọ n’ahịrị n’ọnụ okporoụzọ esi abanye ọdọụgbọelu nke na-eme ka ụgbọelu gbanahu ụfọdụ ndị njem.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị na-eji ụgbọala ọha arụ ọrụ nakwa ndị njem nyere mkpesa na ha na agabiga nsogbu kemgbe amalitere atụmatụ ikwụsị iji akwụkwọ ego akụ ụgwọ ma ha batawa n’ọdọụgbọelu nke mere ka onyeisiala Tinubu nye iwu ka-akwụsitụ ya.

    Gụọ akụkọ ọzọ ebea:

  16. Naịjirịa akwụsịla njem ịga Ala Nsọ n'ihi esemokwu Middle East

    Cheta na ọtụtụ puku Ndị Kraịst Naịjirịa na-aga njem nsọ kwa afọ n’ebe Baịbụl kwuru na Jerusalem, Betlehem na Nazaret.

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Cheta na ọtụtụ puku Ndị Kraịst Naịjirịa na-aga njem nsọ kwa afọ n’ebe Baịbụl kwuru na Jerusalem, Betlehem na Nazaret.

    Ndị ọchịchị Naịjirịa akwụsịla njem niile na-aga Izrel na West Bank ozugbo, n'ihi nsogbu nchekwa maka esemokwu na-akawanye njọ na mpaghara Middle East.

    Ọ bụ otu na-ahụ maka ịhazi njem Ndị Kraịst nke Naịjirịa bụ Nigerian Christian Pilgrim Commission (NCPC), kwupụtara mkpebi a.

    N'okwu ha, ụlọọrụ ahụ kwuru na ihe a dị mkpa iji mee ka "nchekwa na ọnọdụ dị mma" nke ndị njem ala nsọ Naịjirịa buru ụzọ.

    Ka ọ dị ugbua, esemokwu ahụ gbasara n'ofe Middle East mgbe ndị Amerịka na ndị Izrel wakporo Iran, nke gburu onye ndu kachasị elu nke mba ahụ bụ Ayatollah Ali Khamenei.

    Iran azaghachila ha site n'ịwakpo Izrel na mba ndị ha na Amerịka jikọrọ aka na mpaghara Gulf.

    Ọzọ, a kagbuola ọtụtụ ụgbọelu na-aga mpaghara Middle East, ebe mba dị iche iche na mpaghara ahụ mechiri ụzọ ụgbọelu ha, nke mere ka ndị njem nọrọ n'ọnọdụ adịghị mma.

    Nkwụsị njem Ndị Kraịst metụtara njem niile gọọmentị haziri yana ndị ọrụ njem onwe ha haziri.

    Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na mmachibido iwu ahụ ga-adịgide ruo mgbe ọnọdụ dị na mpaghara ahụ ga-adị mma.

    Cheta na ọtụtụ puku Ndị Kraịst Naịjirịa na-aga njem nsọ kwa afọ n’ebe Baịbụl kwuru na Jerusalem, Betlehem na Nazaret.

    Njem ndị a, nke gọọmentị steeti na-enye ego maọbụ na-ahazi, so n'ihe ndị dị mkpa na kalenda okpukperechi Kraịst na Naịjirịa.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  17. Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n’ụgwọọnwa ndị ọrụ n'ọnwa Febrụwarị

    Charles Soludo

    Ebe foto si, Charles Soludo

    Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n’ụgwọ ọnwa Febrụwarị nke ọtụtụ ndị ọrụ.

    E wepụrụ ego n’ụgwọ ọnwa ha maka na ha abịaghị ọrụ n’ụbọchị Monde.

    Gọọmenti steeti ahụ machiburu ịnọ n'ụlọ n'ụbọchị Monde ma dọọ ndị ọrụ bekee aka na ntị na ọ ga-abụzị,"onye arụghị, ọ gaghị eri".

    Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Law Mefor kwuru na ozi o wepụtara sị,"Achọrọ m ka onye ọrụoyibo ọbụla mara na anyị na-ahụ mbọ ha."

    Ọ gara n'ihu kwuo, "Anyị ji ndị Anambara ụgwọ ịhụ na eji ego ha eme ka o kwesịrị, ọbụladi ma ọ gaeme ka mee ihe ga-afụ ụfụ ime."

    Mefor gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na "etu e si ewepụ ego ahụ n'ụgwọ ọnwa ha bụ a gbakọọ mọnde ole onye ahụ abịaghị, e wepụ ihe ọ pụtara n'ụgwọ ọnwa onye ahụ".

    Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ mkpebi gọọmenti Anambra dịka etu a ga-esi kwụsị adịghị abịa ọrụ n'ụbọchị monde.

    Mana mgbe BBC jụrụ Mefor na a na-ewepụ ego n'ụgwọ ọnwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụrụ gọọmentị ọrụ ka ọ sara sị "amaghị m maka nke a, mana ọ bụ kọmịshịọna na-ahụ maka akụnụba ga-ama na ha e na-ewepụ ego".

  18. Etu agha dị n’Ịran ga-esi metụta ọnụahịa mmanụ na mbaụwa

    Etu agha dị n’Ịran ga-esi metụta ọnụahịa mmanụ na mbaụwa

    Ebe foto si, Getty Images

    Agaala n’ihu na-enwe ọgbaaghara n’etiti Ịran, Amerịka na Izrel kemgbe e gbuchara onyendu kachasị n’Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei.

    Dịka Izrel na Amerịka gara n’ihu na-awakpo obodo Ịran dị iche iche, Ịran amụbaala mwakpo ha na-eme n’ụlọọrụ Amerịka dị iche iche nakwa akụrụngwa ndị na-enye ikike na mpaghara Middle East.

    Mpaghara ọzọ a tụrụ anya na agha a ga-emetụta bụ ngalaba ikike.

    Ọnụahịa otu barel mmanụ agbịdị ejirila pasenti anọ rịa elu dịka ọgbaaghara a gara n’ihu na-efesa na Middle East.

    N’ụbọchị Tuzde, e rere otu barel mmanụ gaasị n’ọnụego dọla iri asatọ, nke kachasị kemgbe mmalite afọ a.

    Ịran emechiela Strait of Hormuz, nke bụ ụzọ mmiri dị warawara e si ebupụ mmadụ, nke jikọtara mpaghara Gulf na Indian Ocean.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    BBC kpọtụụrụ onye ọkachamara na-ahụ maka ikike na Naịjiria bụ Ọkankụzi Ahmed Adamu, onyenkụzi na mahadum Philomath University dị na Naịjirịa, onye kwuru na ọnọdụ dị na Middle East ga-emetụta ọnụahịa mmanụ na Naịjirịa.

    “Ọ bụ ihe na-enweghị mgbagha na ọnụahịa mmanụ ga-arị elu na mbaụwa n’ihi na Ịran bụ mba nke anọ kachasị emepụta mmanụ agbịdị n’ụwa.”

    Ọ dọrọ aka na ntị na ọnụahịa mmanụ ụgbọala na gaasị nwereike ịrị elu n’ihi ịrị elu nke ọnụahịa mmanụ agbịdị na mbaụwa.

    Ndị ọkachamara kwenyere na ọ bụ eziokwu na ịrị elu n’ọnụahịa mmanụ agbịdị nwereike kwalite ego mkpata Naịjirịa, mana ọ ga-emetụta ọnụahịa a na-ere otu lita ha na Naịjirịa.

    Nke a ka o kwuru ga-emetụta ọtụtụ ngalaba, dịka ime njem nakwa ihe dị iche iche ndị mmadụ ji eme ihe.

  19. NAFDAC ekwuola na ịmachi mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa ga-ebelata aṅụrụma n’etiti ụmụaka

    NAFDAC ekwuola na ịmachi mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa ga-ebelata aṅụrụma n’etiti ụmụaka

    Ebe foto si, NAFDAC, Getty

    Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ụzọ e si eji ihe oriri na ọgwụ eme ihe na Naịjirịa (NAFDAC) bụ Mojisola Adeyeye akọwaala ihe mere e ji machie mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa gburugburu Naịjirịa.

    Adeyeye kwuru na mmachi ahụ bụ ụzọ kachasị mma a ga-esi gbochie ogogo na-arị elu ụmụaka ji aṅụ mmanya ndị na-aba n’anya na Naịjirịa.

    Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC nyere nkọwa a n’Abuja n’ụbọchị Tuzde 3 Maachị 2026 n’ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere iji malite mmachi ahụ.

    NAFDAC press statement

    Ebe foto si, NAFDAC/X

    O kwuru na ụlọọrụ NAFDAC ga-agbakọọrọ ụlọọrụ National Orientation Agency (NOA), na Federal Competition and Consumer Protection Commission (FCCPC) aka iji mejupụta mmachi ahụ.

    Dịka Adeyeye siri kwuo, ịmachi mmanya ọkụ ndị a gbanyere n’obere akpa nakwa obere karama ndị a pụrụ izo ngwangwa ga-ebelata etu ụmụaka si enweta mmanya ọkụ.

    Ọ kọwakwara na mmanya ọkụ ka bụkwa otu n’ime ihe ndị a kachasị emetọ n’etiti ndị na-eto eto.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  20. Igbo nwe mmadụ, ụnụ abọọla chi?, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 4 Maachị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na onyonyoo dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!