Tinubu achụọla ndị isi ọrụ nchekwa niile, tinye ndị ọhụrụ

Mgbe e biputara ya

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu achụọla ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa niile, tinyere ndị isi ndị agha ala, ndị agha elu, ndị agha mmiri, na ndị uweojii.

  • Maj. Gen. Christopher .G Musa nọchiri anya Lucky Irabor onye jibu ọkwa 'Chief of Defence Staff'
  • Maj. Gen. Taoreed. A Lagbaja nọchiri anya Faruk Yahaya onye jibu ọkwa 'Chief of Army Staff'
  • Rear Admirral E. A Ogalla nọchiri anya Awwal Zubairu Gambo onye jibu ọkwa 'Chief of Naval Staff'
  • Hassan Bala Abubakar nọchiri anya Oladayo Amao onye jibu ọkwa 'Chief of Air Staff'
  • DIG Kayode Egbetokun nọchiri anya Usman Alkali Baba jibu ọkwa 'Inspector General of Police'
  • Adeniyi Bashir Adewale ga-abụ onyeisi ngalaba 'Customs' ọhụrụ na nchereoge iji nọchie anya Hameed Ibrahim Ali bụbu onyeisi ngalaba ahụ
  • Maj. Gen. Emmanuel Akomaye Parker Undiandeye nọchiri anya Samuel Adebayo bụ onye jibu ọkwa 'Chief of Defense Intelligence'
  • Nuhu Ribadu (bụbu onyeisi ngalaba EFCC n'oge gara aga) nọchiri anya Babagana Monguno dịka 'National Security Adviser'

Lee ndị ọzọ Tinubu họrọ n'ọrụ taa bụ Jun 19

  • Col. Adebisi Onasanya ọchịagha ga na-elekọta 'Brigade of Guards'
  • Lt. Col. Moshood Abiodun Yusuf ga-abụ onyeisi '7 Guards Battalion' dị n'Asokoro, Abuja
  • Lt. Col. Auwalu Baba Inuwa 177 ga-abụ onyeisi 'Guards Battalion' dị na Keffi, Nasarawa Steeti
  • Lt. Col. Mohammed J. Abdulkarim ga-abụ onyeisi '102 Guards Battalion' dị na Suleja, Niger Steeti
  • Lt. Col. Olumide A. Akingbesote ga-abụ onyeisi '176 Guards Battalion' dị na Gwagwalada, Abuja
  • Maj. Isa Farouk Audu ga-abụ onyeisi 'State House Artillery'
  • Capt. Kazeem Olalekan Sunmonu ga-abụ osote onyetet 'State House Artillery'
  • Maj. Kamaru Koyejo Hamzat ga-abụ onyeisi 'State House Military Intelligence'
  • Maj. TS Adeola ga-abụ onyeisi 'State House Armament'
  • Lt. A. Aminu ga-abụ osote onyeisi 'State House Armament'

Tinubu kpọpụtakwara aha ndị ndụmọdụ pụrụ iche anọ. Ha gụnyere:

  • Hadiza Bala Usman - onye ndụmọdụ pụrụ iche na ngalaba Policy Coordination
  • Hannatu Musa Musawa - onye ndụmọdụ pụrụ iche na ngalaba okwu ọdịnala na ịkpa obi ọma, nke a na-akpọ na bekee 'Culture and Entertainment Economy'
  • Abdullahi Abubakar Gumel -Nnukwu onye ndụmọdụ pụrụiche n'okwu gbasara ndị omeiwu Sinetị
  • Olarewaju Kunle Ibrahim Nnukwu onye ndụmọdụ pụrụiche n'okwu gbasara ndị omeiwu 'House of Reps