Etu ndị mba Amerịka 37 si agbụrụ Igbo si mee emume iza aha Igbo n'Enugwu

Mgbe e biputara ya

Otu Ohaneze Ndigbo anabatala mmadụ iri atọ na asaa ndị isi ojii si mba Amerịka chọpụtara na ha si agbụrụ Igbo.

E meere ndị ahụ bụ ụmụakwụkwọ na ndị na-arụ ọrụ n'ụlọakwụkwọ Morehouse College Glee Club dị n' Atlanta, Amerịka emume iji gụ ha aha Igbo n'ọgbakọ pụrụ iche nke otu Ọhaneze Ndigbo na eze Ibagwa-Aka dị n' Igbo-Eze South Enugwu Steeti bụ Igwe Hyacinth Eze, nọ n' isi ya na mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.

Alex Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuchitere Ohaneze kọwara na njem ndị ahụ bịara nakwa aha a gụrụ ha dị mkpa iji me ka ha mara onwe ha.

Ogbonna gwara BBC na ndị ahụ bụ ndị Igbo ezupuru mgbe e ji ndị isi ojii agba ohu.

"Mana ihe a wutere m n'ihi na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Igbo nke gosiri na Igbo erere (n'oge ịgba ohu) karịrị" ka Ogbonna kwuru.

Ihe mere emume igụ aha a ji dị mkpa

Ogbonnaya kọwara ihe mere emume ịgụ aha a ji dịrị ndị ahụ bịara njem mkpa.

Ọ kọwara na mgbe niile echiche amaghi onwe ha ga na-enye ha nsogbu mana ugbua a gụrụ ha aha Igbo, mkpụrụ obi ha ga-eru ala.

Ogbonnaya kọwara sị,"Ọ dị ka mmadụ nwụọ akwaghị ya, ọ bụru ozu akwaghi akwa na-enye nsogbu mana a gụọ aha ndị be gị, ọ na-atọ ụtọ."