'Ndị uweojii ịkpọpụta ndị a na-enyo maka mpụ n'ọha megidere iwu'

Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe n'Abuja kpebiri ka ọnyeịsị ụweọjịi Naịjịrịa kwụọ nwunye M.K.O Abiola bụ ọkammuta, Zainab Abiola ego ruru N52m maka inwuchi ya na ịgọsịgharị ya ọha ebe o yi naanị uwe abalị.

N’ikpe ahụ nke Justice Modupe Osho-Adebiyi nyere, o nyekwara ndị uweojii iwu ka ha rịọ Abiola mgbaghara n’akwụkwọ akụkọ abụọ a mara ama na Naịjịrịa.

Abiola kpụpụrụ ndị uweojii ahụ n'ụlọikpe n'afọ 2022 'ebubo na ha wakporo ụlọ ya dị n'Abuja ma jide ya ka ọ yi uwe abalị wee kpụrụ ya bata n'ụlọọrụ ha. O kwuru na ha megidere ugwu na ikike dịịrị ya.

Ajụjụ onye ọbụla kpụ n'ọnụ bụ ma iwu akwadoro ndị uweojii igosigharị ndị a nwụchiri a na-ekpebeghi ikpe?

Iwu akwadoro ndị uweojii igosigharị ndị a nwụchiri a na-ekpebeghi ikpe?

Anyị na ọkaiwu Peter Aja kpara maka okwu a, ọ kọwara na igosịgharị onye a na-enyo enyo ka uwa hụ ya putara na e kpezugo ikpe ahu, na ọbaghịzị ụrụ ịje ụlọ ịkpe.

N'okwu ya; “ihe gbasara igosigharị onye a na-enyọ enyọ ka uwa hụ ya tupu ụlọịkpe ekpebịe ịkpe ya bụ ihe iwụ na-achị Naịjịrịa amaghị maka ya maka na usoro ikpe na Naịjịrịa kwuru na aka onye a na-enyo enyo ka dị ọcha rụọ mgbe ụlọikpe kpebiri ikpe ya, maa ya ịkpe”.

Ọ gara n'ihu kwuo, “onye ọbụla na-egọsịgharị onye a na-enyo enyo amaala ya ịkpe, maka na ihe ị na-agwa uwa nile bu na onye a dara iwu mere i ji egọsị ihu ya”.

“Ọ dị njọ ndị uweọjịi maọbụ ndị ọzọ ị na-egọsịgharị ihu mmadụ, ghara ije ụlọikpe na mbụ ebe a ga-ekpe ikpe ma kpebie ya”.

Gịnị ka iwu kwuru?

Ngalaba 36 akwụkwọ iwu Naịjirịa kwuru na aka mmadụ dị ọcha ruo mkpe ụlọikpe kpebiri na o mere ihe ọjọọ ọbụla. Dịka ọkaiwu Peter siri kwuo, "ịgbọpụta mmadụ n'ọha na-ekpe ya ikpe n'ihu ndị ntaakụkọ oge ụlọikpe ekpebeghi ya ikpe bụ imegide ugwu na ikike dịịrị onye".

Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị uweojii na ndị ngalaba nchekwa ndị ọzọ niile kwusị ụdị agwa ahụ dịka o megidekwara iwu ugwu na ikike dịịrị onye nke African Charter on Human and Peoples Rights Act.