Kedu ebe Nnamdi Kanu nọ? Ihe Geoffrey Onyeama kwuru

Mgbe e biputara ya

Onye ntaakụkọ aha ya bụ Simon Ateba na arụ ọru na ulo ntaakụkọ Today News Afrịka jụrụ Geoffrey Onyeama maka onọdu Nnamdị Kanu n'ime ajụju ndị ọzọ ọ jụrụ.

Mgbe Maazị Onyeama tinyere ọnụ na ya bụ okwu, ọ gaghị i'ihu saa ya etu esi juo ya.

Ọ sị na ya gụrụ akụkọ n'ụtụtụ ahụ ebe onye bụbụ gọvanọ Imo steeti bụ Orji Uzọ Kalu kwuru na Maazi Kanu nọ na Briten na-ezu ike.

Maazi Onyeama nwere ịza ajụjụ ahụ mee ihe ọchị mgbe ọ sị ka ndị ntaakụkọ ekwukwana na ya kwuru makana ọbụghi ya kwuru.

Cheta na Kemgbe afo gara aga ebe Nnamdi Kanu nọ bụ ihe ọtụtụ mmadu na-acho ịmata.

Onwere ndị na-asị na ọ nọ n'ime ụgbọmmiri, nwekwa ndị sị na ọ nala mmụọ, ka ndị ọzọ, dịka Orji Kalu, na-ekwu na ọ na mba Briten, bụ ebe onwere akwụkwọ dịka nwaafọ.

Ndịagha Naịjirịa, bụ ndị ndị Ipob (otu Kanu) na-ebo na ọ bụ ha ma ihe mere nwa Amadị a, na-ago aka na ukwu na ha amaghị ọnọdị ya.

BBC Igbo jụrụ nwunye Kanu ma ọ ma ebe di ya nọ mgbe ụlọ ntaakụkọ a na ya nwere mkparịtaụka, lee ihe okwuru ebe a:

Gọọmentị Naịjirịa sakwara ebubo nwunye Kanu boro ha na aka ha dị n'ihe mere di ya mgbe Lai Mohammed gwara ndi ntaakụkọ BBC na 'nwunye Kanụ na-arọ nrọ'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: