Anyi achọghị Buhari na Atiku - Otu ugwu hausa

Mgbe e biputara ya

Otu kporo onweha 'The Coalition of Northern Groups' na bekee gwara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhuri na onye chiburu dịka osote onyeisiala n'oge garaaga bụ Atiku Abubakar na ọ ga-adị mma maọbụrụ na ha abụọ wepuru aka n'ime ọsọ ị banye n'ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 2019.

Otu a kwuru na ha na-ekwusi okwu ike makana ha abụọ bụ Buhari na Atiku karịrị afọ iri asaa na kwa na ndị ntorobia kwesiri ị bụ ndị ga-achị Naịjirịa ugbua na kwa n'iru.

Ha kwukwara na ọ bụ ndị chiburu Naịjiria n'oge garaaga burukwa ndị ka goro nka bụ ndị mebiri Naịjirịa, na kwa oge eruola ndị ntorobia buru Naịjirịa gawa ala ekwere nkwa.

Otu ha kwuru okwu a n'ime akwụkwọ a dere na ngwụcha ọgbakọ ha na Kaduna n'ụbọchị Monde.

Cheta n'ọbụ ndị otu a sị ka ndị Igbo bị na mpaghara ugwu hausa kwara lawa.

Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu azaala otu a.

Shehu kwuru na onweghị iwu ọbụla na Naịjirịa kwuru na onye karịrị afọ iri asaa anaghị enwe ike ị so n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa.

Onweghị ihe Atiku Abubakar kwuru ugbua maka okwu a otu nke a na-ekwu.

Otu a kwukwara na ihe kachasị dị ha mkpa bụ ka gọọmentị leba anya na ntụlịaka maka ị nwere onwe nke a kpọrọ 'referendum' na bekee.