Onye odee akwụkwọ ndi otu CAN awụọla

Mgbe e biputara ya

Onye bụ ode akwụkwọ ndị otu Christian Association of Nigeria (CAN) bụ Musa Asake anwuola.

Amabeghị ihe gbụrụ ya, mana akụkọ anyi na eso na-akọwa na ọ nwụrụ n'ụtụtu tata n'Abuja.

Ọ rịara ọrịa, bụ ihe a na-ele anya bu ihe butere ọnwụ ya.

Ihe a bụ izuụka abụọ Maazị Asake nọ n'isi ndị CAN gara ngagharị iwe make ogbugbu ha na-ebo ndi Fulani na-achị ehi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Musa Asake bụ onye Kaduna steetị, ma bụrụ onye ọnu na-eru n'okwu banyere ihe metụtara ndi uka na ndi ndida Kaduna steeti.

Akuko banyere ihe a ka na-abịa.