You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ngwa ahịa agbaala ọkụ n'Alaba International
Mgbe e biputara ya
Ọkụ agbaala ụlọ ngwa ahịa anọ akpọrọ warehouse n'olu bekee n'Alaba International.
Onye hụrụ n'anya nọ mgbe ihe mberede a mere akpọrọ Chinedu kwuru na ọkụ a bidoro n'elekere anọ nke mgbede a.
Ọ sị na tupu ụlọ ọru na-ahụ maka mmenyụ ọkụ abiaghị n'oge.
Ọ sị na n'ime ụgbọ ha atọ biara imenyụ ọkụ ahụ, otu ebughị mmiri.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Chinedu kwuru na onweghị onye meruru ahụ maọbụ onye ọkụ gbagburu karia ma ọtụtụ ngwa ahia gbaara ọkụ.
Ọ sị na oruru ihe karịrị 'container 40 feet' iri n'ime ụlọ ngwa ahịa ahụ.
Chinedu gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị China nwee ya bụ ụlọ ngwa ahịa.